Abụ Ọma 68:1-35
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. Abụ ọma.
68 Ka Chineke bilie. Ka a chụsasịa ndị iro ya,Ka ndị kpọrọ ya asị sikwa n’ihu ya gbafuo.+
2 Chụsaa ha otú ifufe si efesasị anwụrụ ọkụ.
Ka ndị ajọ omume laa n’iyi n’ihu Chineke+Otú ọkụ si agbaze mgbá aṅụ.*
3 Ma, ka ndị ezi omume ṅụrịa ọṅụ.+
Ka ha ṅụrịa ezigbo ọṅụ n’ihu Chineke.
Ka aṅụrị na obi ụtọ ju ha obi.
4 Bụkuonụ Chineke abụ. Bụọnụ abụ iji too aha ya.+
Bụkuonụ Onye na-agafe n’ọzara* abụ.
Aha ya bụ Jaa.*+ Ṅụrịanụ ọṅụ n’ihu ya.
5 Chineke nọ n’ebe dị nsọ o bi.+
Ọ bụ nna ụmụ na-enweghị nna, bụrụkwa onye na-echebe* ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.+
6 Chineke na-enye ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka ụlọ ha ga-ebi.+
Ọ na-akpọpụta ndị mkpọrọ ma mee ka ha baa ọgaranya.+
Ma ndị isi ike* ga-ebi n’ala kpọrọ nkụ.+
7 Chineke, mgbe i du ndị gị,+Mgbe ị gafere n’ọzara, (Sila)
8 Ala mara jijiji.+
Chineke mere ka mmiri si n’eluigwe zoo.
Chineke, bụ́ Chineke Izrel, mere ka Saịnaị nke a maa jijiji.+
9 Chineke, i mere ka mmiri zosie ike.
I mere ka ndị gị* ike gwụchara nweghachi ume.
10 Ha bi n’ụlọikwuu gị.+
Chineke, i gbooro ndị ogbenye mkpa ha n’ihi na ị dị mma.
11 Ọ bụ Jehova na-enye iwu.
Ụmụ nwaanyị ndị na-ezisa ozi ọma dị ọtụtụ.+
12 Ndị eze na ndị agha ha na-agbalaga.+ Ha na-agbalaga.
Nwaanyị nọ n’ụlọ na-eso eketa ihe a kwatara n’agha.+
13 N’agbanyeghị na unu* dina n’ebe unu kwanyere ọkụ n’akụkụ ụlọikwuu unu,Unu ga-enweta nduru nku ya bụ ọlaọcha,Nke ábụ́bà* ya bụkwa ezigbo ọlaedo.*
14 Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile chụsasịrị ndị eze ala ahụ,+Snoo dara na Zalmọn.*
15 Ugwu Beshan+ bụ ugwu Chineke.*
Ugwu Beshan nwere ọtụtụ ebe dị elu na ya.
16 Gị ugwu nwere ọtụtụ ebe dị elu na ya, gịnị mere i ji eleUgwu Chineke họọrọ* ka ọ bụrụ ebe ọ ga-ebi anya ọjọọ?+
N’eziokwu, Jehova ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi.+
17 Ụgbọ ịnyịnya agha Chineke dị iri puku kwuru iri puku, puku kwuru puku.+
Jehova esila na Saịnaị bata n’ebe dị nsọ.+
18 Jaa bụ́ Chineke, ị rịgooro n’elu.+
Ị kpọọrọ ndị a dọọrọ n’agha.
Ị kpọọrọ ụmụ nwoke ka ha bụrụ onyinye.+
N’eziokwu, ị kpọọrọ ndị isi ike+ ka ha na ha biri.
19 Ka e too Jehova, onye na-eburu anyị ibu anyị kwa ụbọchị,+Ezi Chineke, onye na-azọpụta anyị. (Sila)
20 Ezi Chineke bụụrụ anyị Chineke na-azọpụta anyị.+
Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova na-anapụta anyị n’aka ọnwụ.+
21 N’eziokwu, Chineke ga-akụri isi ndị iro ya,Ya bụ, isi onye ọ bụla na-ekweghị ahapụ ihe ọjọọ ọ na-eme.+
22 Jehova ekwuola, sị: “M ga-esi na Beshan kpọghachi ha.+
M ga-esi n’ala ala oké osimiri kpọghachi ha,
23 Ka i wee zọọ ọbara ndị iro gị ụkwụ,+Ka nkịta gị rachaakwa ọbara ndị iro gị.”
24 Chineke, ha na-ahụ ka ndị gị kwụ n’ahịrị na-aga.
Chineke m, bụ́ Eze m, ha na-ahụ ka ndị gị kwụ n’ahịrị na-abanye n’ebe dị nsọ.+
25 Ndị na-abụ abụ na-aga n’ihu, ndị na-akpọ ụbọ akwara esoro ha n’azụ.+
Ụmụ agbọghọ ndị na-akụ obere ịgbà nọ n’agbata ha.+
26 Unu ndị Onyenwe Izrel nyere ndụ,+ toonụ Chineke.
Nọrọnụ n’ọgbakọ buru ibu too Jehova.
27 Benjamin,+ bụ́ ọdụdụ nwa, na-emeri ha.
Ndị isi Juda na ìgwè mmadụ ndị na-eti mkpu ha na ha so na-emerikwa,Nakwa ndị isi Zebulọn na ndị isi Naftalaị.
28 Chineke gị ekwuola na ị ga-adị ike.
Chineke, biko, gosi ike gị, gị onye gbachiteere anyị.+
29 Ndị eze ga-ewetara gị onyinye+Maka ụlọ nsọ gị nke dị na Jeruselem.+
30 Baara anụ ọhịa ndị nọ n’ebe ahịhịa amị dị mba,Bụ́ ìgwè oké ehi+ na ụmụ haRuo mgbe ndị mmadụ ga na-akpọ isiala ma na-eweta ọlaọcha.*
Ma, ọ na-achụsasị ndị ịlụ agha na-atọ ụtọ.
31 A ga-esi n’Ijipt bute arịa ndị e ji ọla nchara rụọ.*+
Kush ga-eme ngwa ngwa nye Chineke onyinye.
32 Unu alaeze ndị dị n’ụwa, bụkuonụ Chineke abụ,+Bụkuonụ Jehova abụ otuto, (Sila)
33 Bụkuonụ Onye na-agbafe n’eluigwe niile nke dịwara kemgbe oge ochie abụ.+
Lee, olu ya nke dị ebube na-adasi ụda ike.
34 Kwuonụ na Chineke nwere ike dị ukwuu.+
Ọ bụ ya na-achị Izrel,A na-ahụkwa ike ya na mbara igwe.*
35 A na-atụ egwu Chineke, na-akwanyekwara ya ùgwù n’ebe nsọ ya* dị ebube.+
Ọ bụ Chineke Izrel,Onye na-enye ndị ya ike na ume.+
Toonụ Chineke.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
^ O nwere ike ịbụ, “n’elu ígwé ojii.”
^ “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Na Hibru, “onyeikpe.”
^ Ma ọ bụ “ndị na-enupụ isi.”
^ Na Hibru, “ndị i ketara.”
^ Ma ọ bụ “unu ụmụ nwoke.”
^ Ma ọ bụ “ugbene.”
^ Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
^ Ma ọ bụ “Ọ dị ka à ga-asị na snoo dara na Zalmọn.”
^ Ma ọ bụ “ọmarịcha ugwu.”
^ Ma ọ bụ “nwere mmasị na ya.”
^ O nwere ike ịbụ, “ma na-azọ ọlaọcha ụkwụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ndị nnọchiteanya ga-esi n’Ijipt pụta.”
^ Na Hibru, “n’ígwé ojii.”
^ Na Hibru, “gị.”