Abụ Ọma 114:1-8
114 Mgbe Izrel si n’Ijipt pụta,+Mgbe ezinụlọ Jekọb si n’obodo ndị na-asụ asụsụ ọzọ pụta,
2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke.
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.+
3 Oké osimiri hụrụ ya gbaa ọsọ.+
Osimiri Jọdan laghachiri azụ.+
4 Ugwu ukwu niile wụliri elu ka ebule.+
Ugwu nta niile wụliri elu ka ụmụ atụrụ.
5 Oké osimiri, gịnị mere i ji gbaa ọsọ?+
Osimiri Jọdan, gịnị mere i ji laghachi azụ?+
6 Ugwu ukwu, gịnị mere unu ji wụlie elu ka ebule?
Ugwu nta, gịnị mere unu ji wụlie elu ka ụmụ atụrụ?
7 Ụwa, maa jijiji n’ihi Onyenwe anyị,N’ihi Chineke Jekọb,+
8 Onye na-eme ka oké nkume bụrụ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru,Onye na-eme ka oké nkume siri ike bụrụ isi mmiri.+