Abụ Ọma 114:1-8

  • Otú e si kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt

    • Oké osimiri gbara ọsọ (5)

    • Ugwu wụliri elu ka ebule (6)

    • E mere ka oké nkume siri ike bụrụ isi mmiri (8)

114  Mgbe Izrel si n’Ijipt pụta,+Mgbe ezinụlọ Jekọb si n’obodo ndị na-asụ asụsụ ọzọ pụta,  2  Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke. Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.+  3  Oké osimiri hụrụ ya gbaa ọsọ.+ Osimiri Jọdan laghachiri azụ.+  4  Ugwu ukwu niile wụliri elu ka ebule.+ Ugwu nta niile wụliri elu ka ụmụ atụrụ.  5  Oké osimiri, gịnị mere i ji gbaa ọsọ?+ Osimiri Jọdan, gịnị mere i ji laghachi azụ?+  6  Ugwu ukwu, gịnị mere unu ji wụlie elu ka ebule? Ugwu nta, gịnị mere unu ji wụlie elu ka ụmụ atụrụ?  7  Ụwa, maa jijiji n’ihi Onyenwe anyị,N’ihi Chineke Jekọb,+  8  Onye na-eme ka oké nkume bụrụ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru,Onye na-eme ka oké nkume siri ike bụrụ isi mmiri.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji