Abụ Ọma 122:1-9

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka udo dị na Jeruselem

    • Ịga n’ụlọ Jehova na-eme obi ụtọ (1)

    • Ụlọ ndị dị na Jeruselem dịkọtara ọnụ (3)

Abụ Mgbago. Abụ Devid. 122  Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sịrị m: “Ka anyị gaa n’ụlọ Jehova.”+   Ugbu a, Jeruselem, anyị abatalaN’ọnụ ụzọ ámá gị wee guzoro n’ime gị.+   A rụrụ ụlọ ndị dị n’obodo JeruselemOtú ha ga-adịkọta ọnụ.+   Ebo dị iche iche nke Jaa*Agbagotela n’obodo aKa ha too aha Jehova,+Otú e nyere Izrel n’iwu.   N’ihi na ọ bụ n’obodo a ka a dọsara ocheeze a na-anọ ekpe ikpe,+Ya bụ, ocheeze ezinụlọ Devid.+   Rịọnụ arịrịọ ka udo dị na Jeruselem.+ Obi ga-eru ndị ji gị* kpọrọ ihe ala.   Ka udo dị n’ime mgbidi gị niile siri ike. Ka obi ruo ndị bi n’ụlọ elu gị ndị a rụsiri ike ala.   N’ihi ụmụnne m na ndị enyi m, m ga-asị: “Ka udo dị n’ime gị.”   M ga na-ekpe ekpere ka ihe dịrị gị ná mmaN’ihi ụlọ Jehova Chineke anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ya bụ, Jeruselem.