Abụ Ọma 64:1-10

  • Chineke ga-echebe ndị ya

    • ‘Chineke ga-agba ndị iro akụ́’ (7)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 64  Chineke, biko, nụrụ olu m mgbe m na-arịọ gị arịrịọ.+ Chebe ndụ m ka m ghara ịtụ onye iro ụjọ.   Mee ka nkata ndị ọjọọ na-akpa na nzuzo ghara ikpudo m+Nakwa ka ìgwè ndị ajọ omume ghara ịkpara m aka.   Ha na-amụ ire ha ka ọ dị nkọ ka mma agha. Ha na-adị njikere ikwu okwu ọjọọ ka à ga-asị na ha chọrọ ịgbapụ akụ́,   Ka ha nọrọ n’ebe ha zoro gbaa ya onye aka ya dị ọcha. Ha na-agba ya onye ahụ na mberede n’atụghị egwu.   Ha anaghị akwụsị iche echiche ọjọọ.* Ha na-akpa otú ha ga-esi sie ọnyà. Ha na-asị: “Ònyekwanụ ga-ahụ ọnyà ndị ahụ?”+   Ha na-echepụta ụzọ ọhụrụ ndị ha ga-esi na-eme ihe ọjọọ. Ha na-eji aghụghọ agba izu wee chepụta ihe ọjọọ ha ga-eme.+ Mmadụ enweghị ike ịghọta ihe onye nke ọ bụla na-eche n’obi ya.  Ma Chineke ga-agba ha akụ́.+ Akụ́ ga-emerụ ha ahụ́ na mberede.   Ire ha ga-akpatara ha ọdachi.+ Ndị niile na-ele ha anya ga-efufe isi.   Egwu ga-ejidezi mmadụ niile. Ha ga-akọsa ihe Chineke mere,Ha ga-aghọtakwa ọrụ dị iche iche ọ na-arụ.+ 10  Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova, ọ ga-agbabakwa n’ime ya.+ Ndị niile obi ha dị ọcha ga-enwe obi ụtọ.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ha na-agba ibe ha ume ka ha mee ihe ọjọọ.”
Ma ọ bụ “ga-anya isi.”