Abụ Ọma 27:1-14
Abụ Devid.
27 Jehova bụ ìhè m+ na onye na-azọpụta m.
Ònye ka m ga-atụ egwu?+
Jehova bụ idé ji ndụ m.+
Ònye ka m ga-atụ ụjọ?
2 Mgbe ndị ọjọọ lụsoro m ọgụ ka ha laa m n’iyi,+Ọ bụ hanwa bụ́ ndị iro m na ndị na-emegide m zọhiere ụkwụ wee daa.
3 Ọ bụrụgodị na ndị agha amaa ụlọikwuu ka ha lụso m agha,Obi agaghị amapụ m.+
Ọ bụrụgodị na a lụso m agha,Obi ka ga-esi m ike.
4 Otu ihe ka m rịọrọ Jehova.
Ọ bụ ihe m na-achọ.
Ka m biri n’ụlọ Jehova ná ndụ m niile,+Ka m wee na-ahụ otú Jehova si dị mma,Na-enwekwa obi ụtọ ka m na-ele ụlọ nsọ ya anya.+
5 N’ihi na ọ ga-ezo m n’ụlọ ya n’ụbọchị ọdachi ga-abịa.+
Ọ ga-ezo m n’ebe zoro ezo n’ụlọikwuu ya.+
Ọ ga-ekugo m n’elu nnukwu nkume.+
6 Ugbu a, emeriela m ndị iro m niile gbara m gburugburu.
M ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe m na-achụ àjà n’ụlọikwuu ya.
M ga-abụku Jehova abụ otuto.
7 Jehova, biko, nụrụ olu m mgbe m besaara gị ákwá.+
Meere m amara za m.+
8 Obi m echetarala m ihe i nyere n’iwu, sị:
“Chọọnụ m.”*
Jehova, ọ bụ gị ka m ga-achọ.+
9 Ezorola m onwe* gị.+
Ejila iwe chụpụ ohu gị.
Ọ bụ gị bụ onye na-enyere m aka.+
Ahapụla m, agbakụtakwala m azụ, Chineke m, onye na-azọpụta m.
10 Ọ bụrụgodị na nne m na nna m ahapụ m,+Jehova ga-akpọrọ m.+
11 Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+
Duo m n’ụzọ ziri ezi n’ihi ndị iro m.
12 Enyefela m n’aka ndị iro m,*+N’ihi na ndị akaebe ụgha abịala ka ha bo m ebubo,+Ha na-abakwa mba na ha ga-emesi m ike.
13 Ebee ka m gaara anọ ma a sị na enweghị m okwukweNa m ga-anọ ndụ hụ otú Jehova si dị mma?*+
14 Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.+
Nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike.+
Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Chọọnụ ihu m.”
^ Na Hibru, “ihu.”
^ Ma ọ bụ “n’aka mkpụrụ obi ndị iro m.”
^ O nwere ike ịbụ, “N’eziokwu, m nwere okwukwe na m ga-anọ ndụ hụ otú Jehova si dị mma.”