Abụ Ọma 20:1-9
-
A ga-azọpụta eze Chineke tere mmanụ
-
Ụfọdụ tụkwasịrị ụgbọ ịnyịnya obi, ‘ma ọ bụ aha Jehova ka anyị na-akpọ’ (7)
-
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
20 Ka Jehova za gị n’ụbọchị ị na-ata ahụhụ.
Ka aha Chineke Jekọb chebe gị.+
2 Ka o si n’ebe nsọ ya nyere gị aka,+Ka o sikwa na Zayọn kwado gị.+
3 Ka o cheta onyinye niile i nyere ya.
Ka o jiri obiọma nabata àjà i suuru ya ọkụ. (Sila)
4 Ka o meere gị ihe niile obi gị chọrọ,+Meekwa ka ihe niile i bu n’obi ime gaziere gị.
5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na ị na-azọpụta anyị.+
Anyị ga-ebuli ihe àmà anyị elu iji too aha Chineke anyị.+
Ka Jehova mezuo ihe niile ị na-arịọ ya.
6 Ugbu a, amarala m na Jehova na-azọpụta onye o tere mmanụ.+
Ọ na-esi n’eluigwe ya dị nsọ za ya,Wee jiri aka ya siri ike* zọpụta ya.+
7 Ụfọdụ na-atụkwasị ụgbọ ịnyịnya obi, ndị ọzọ na-atụkwasị ịnyịnya obi,+Ma ọ bụ aha Jehova Chineke anyị ka anyị na-akpọ.+
8 Ha adaala kụọ afọ n’ala,Ma anyị ebiliela, e meekwala ka anyị kwụrụ chịm.+
9 Jehova, biko, zọpụta eze.+
Ọ ga-aza anyị n’ụbọchị anyị kpọrọ ya ka o nyere anyị aka.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “aka nri ya.”