Ihe Baịbụl Na-ekwu
Ihe dị na Baịbụl bụ okwu Chineke ma ọ bụ ozi Chineke chọrọ ka anyị nụ n’oge a. Baịbụl gwara anyị otú anyị ga-esi ebi ndụ ka ndụ anyị nwee isi na ihe ndị anyị ga na-eme ka Chineke hụ anyị n’anya. Baịbụl zakwara ajụjụ ndị a:
OTÚ Ị GA-ESI CHỌTA AMAOKWU NDỊ DỊ NA BAỊBỤL
Akwụkwọ ndị dị na Baịbụl dị iri isii na isii. E kere ha ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Arameik (“Agba Ochie”), nke abụọ abụrụ Akwụkwọ Nsọ Grik (“Agba Ọhụrụ”). E kebiri akwụkwọ nke ọ bụla dị na Baịbụl n’isi n’isi nakwa n’amaokwu n’amaokwu. Ọ bụrụ na e dee aha akwụkwọ dị na Baịbụl, nọmba mbụ na-eso ya bụ isi ya, nọmba ọzọ na-eso ya abụrụ amaokwu ya. Dị ka ihe atụ, Jenesis 1:1 pụtara Jenesis isi mbụ, amaokwu mbụ.