Abụ Ọma 8:1-9

  • Ebube Chineke na ùgwù a na-akwanyere mmadụ

    • “Aha gị dị nnọọ ebube” (1,9)

    • ‘Olee uru mmadụ efu bara?’ (4)

    • E ji ùgwù chọọ mmadụ mma (5)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ Devid. 8  Onyenwe anyị Jehova, aha gị dị nnọọ ebube n’ebe niile n’ụwa. I meela ka ebube gị dị ukwuu karịa eluigwe.*+  2  N’ihi ndị iro gị,I sila n’ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ+ gosi ike gị,Ka i wee mee ka onye iro na onye na-emegide gị mechie ọnụ.  3  Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ọrụ aka* gị,Ọnwa na kpakpando ndị i kere,+  4  Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere i ji na-echeta ya? Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?+  5  I mere ka ndị mmụọ ozi* katụ ya. I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.  6  I mere ka o lekọtawa ọrụ aka gị.+ I mere ka ihe niile nọrọ n’okpuru ya:  7  Ìgwè ewu na atụrụ niile na ehi,Nakwa anụ ọhịa dị iche iche,+  8  Nnụnụ na azụ̀,Ihe ọ bụla na-egwugharị n’oké osimiri.  9  Onyenwe anyị Jehova, aha gị dị nnọọ ebube n’ebe niile n’ụwa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Gị onye a na-akọ akụkọ ebube ya n’eluigwe.”
Na Hibru, “mkpịsị aka.”
Na Hibru, “ndị dị ka chi.”