Abụ Ọma 77:1-20
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Nke Jedutọn.* Abụ Esaf.+
77 M ga-ebesara Chineke ákwá.
Ọ bụ Chineke ka m ga-ebesara ákwá, ọ ga-anụkwa olu m.+
2 M chọrọ Jehova n’oge m nọ ná nsogbu.+
N’abalị, m gbasara aka m na-ekpe ekpere. Ike agwụghị m.
Ma a kasighị m obi.
3 M na-asụ ude ma m cheta Chineke.+
Obi anaghị ezu m ike, ike na-agwụkwa m.*+ (Sila)
4 Ị na-ejide mbubere anya m ka ọ ghara imechi.
Ahụ́ anaghị eru m ala, anaghịkwa m ekwuli okwu.
5 M na-echeta oge ndị dị anya gara aga,+Bụ́ afọ ndị dị anya gara aga.
6 N’abalị, m na-echeta abụ m.+
M na-atụgharị uche.+
M na-agbalịsi ike ka m ghọta ihe ndị a.
7 Jehova ọ̀ ga-ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?+
Ọ̀ bụ na e nweghịzi mgbe ọ ga-emere anyị amara?+
8 Ọ̀ bụ na ọ gaghịzi ahụ anyị n’anya ruo mgbe ebighị ebi?
Ọ̀ bụ na ọ gaghịzi emezuru ọgbọ niile nkwa o kwere?
9 Chineke ò chefuola imere anyị amara,+Ka iwe ya ò meela ka ọ kwụsị imere anyị ebere? (Sila)
10 M̀ kwesịrị ịnọ na-asị: “Ọ bụ ihe a na-ewute m:+
Onye Kacha Elu agbanweela otú o si emeso anyị”?
11 M ga-echeta ọrụ niile Jaa na-arụ.
M ga-echeta ihe ndị dị ịtụnanya i mere n’oge dị anya gara aga.
12 M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị niile,Chebakwara ihe dị iche iche ị na-eme echiche.+
13 Chineke, otú i si eme ihe gosiri na ị dị nsọ.
Chineke, olee chi dị ukwuu ka gị?+
14 Ọ bụ gị bụ ezi Chineke, onye na-eme ihe ndị dị ịtụnanya.+
I meela ka ndị dị iche iche mata na ị dị ike.+
15 I jirila ike* gị napụta ndị gị,+Bụ́ ụmụ Jekọb na ụmụ Josef. (Sila)
16 Chineke, mmiri hụrụ gị;Mmiri hụrụ gị malite inugharị.+
Mmiri miri emi malitekwara ime mkpọtụ.
17 Mmiri si n’ígwé ojii zosie ike.
Égbè eluigwe gbara n’ígwé ojii,Àmụ̀mà gị nọkwa na-egbu aghara aghara ka ebe a na-agbapụsị akụ́.+
18 Ụda égbè eluigwe gị+ dị ka mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na-eme.
Àmụ̀mà gburu, ìhè enwuo n’ụwa.*+
Ụwa mere mkpọtụ, maakwa jijiji.+
19 Ị na-esi n’oké osimiri agafe.+
Ị na-esi n’etiti ọtụtụ mmiri agafe.
Ma a naghị ahụ nzọụkwụ gị.
20 I si n’aka Mosis na Erọn+Duo ndị gị otú e si edu ìgwè ewu na atụrụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “mmụọ m.”
^ Na Hibru, “ogwe aka.”
^ Ma ọ bụ “n’ala.”

