Abụ Ọma 113:1-9

  • Chineke na-ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya

    • Ka e too aha Jehova ruo ebighị ebi (2)

    • Chineke na-ehulata (6)

113  Toonụ Jaa!* Unu ndị ohu Jehova, toonụ ya. Toonụ aha Jehova.  2  Ka e too aha Jehova Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+  3  Ka a na-eto aha Jehova+Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ.  4  Jehova dị elu karịa mba niile.+ Ọ dị ebube karịaeluigwe.+  5  Ònye dị ka Jehova Chineke anyị,+Onye bi* n’ebe dị elu?  6  Ọ na-ehulata ka o lee eluigwe na ụwa anya.+  7  Ọ na-esi n’ájá ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya. Ọ na-esi n’ebe a na-ekpofu ntụ* ekulite ogbenye,+  8  Ka o wee mee ka o soro ndị a ma ama nọrọ,Bụ́ ndị a ma ama ná ndị Chineke.  9  Ọ na-eme ka obi dị nwaanyị aga ụtọMaka na ọ mụtala ụmụ n’ụlọ ya.+ Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “nọ n’ocheeze.”
^ O nwere ike ịbụ, “ahịhịa.”
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.