A4
Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru
Otú e si ede aha Chineke ná mkpụrụ akwụkwọ ochie ndị Hibru ji ede asụsụ ha tupu a dọrọ ndị Izrel n’agha laa Babịlọn
Otú e si ede aha Chineke ná mkpụrụ akwụkwọ ndị Hibru ji ede asụsụ ha mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọta
N’asụsụ Hibru, ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ anọ a יהוה bụ aha Chineke. Ọ pụtara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ugboro puku asaa (7,000) n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. A na-akpọ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ a Tetragramatọn. Na Baịbụl a, a sụgharịrị ya “Jehova.” Aha a pụtara ọtụtụ ugboro na Baịbụl karịa aha ọ bụla ọzọ. E nwere aha dị iche iche ndị si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl turu Chineke nakwa ihe ndị ha kpọrọ ya iji gosi ụdị onye ọ bụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” “Onye Kacha Elu,” na “Onyenwe anyị.” Ma, ọ bụ naanị mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ahụ a na-akpọ Tetragramatọn bụ ezigbo aha ha kpọrọ ya.
Ọ bụ Jehova Chineke mere ka ndị dere Baịbụl dee aha ya na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, o ji mmụọ nsọ ya mee ka Joel onye amụma dee, sị: “A ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.” (Joel 2:32) Chineke mekwara ka otu ọbụ abụ dee, sị: “Ka ndị mmadụ mara na aha gị bụ Jehova nakwa na ọ bụ naanị gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.” (Abụ Ọma 83:18) Aha Chineke pụtadịrị ihe dị ka narị ugboro asaa (700) naanị n’akwụkwọ Abụ Ọma. E dekwaranụ Abụ Ọma ka ndị na-efe Chineke buru ya n’isi na-abụ ya. Gịnịzi mere na aha Chineke adịghị n’ọtụtụ Baịbụl ndị mmadụ sụgharịrị? Gịnị mere e ji sụgharịa Tetragramatọn ahụ “Jehova” na Baịbụl a? Olee ihe aha Chineke bụ́ Jehova pụtara?
Ihe a si n’akwụkwọ Abụ Ọma nke dị n’akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu. E dere ya tupu afọ 51 O.N.K. E ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru a na-ejikarị ede ihe mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta dee akwụkwọ Abụ Ọma a. Ma, ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru ochie gbapụrụ iche ka e ji dee Tetragramatọn ahụ ugboro ugboro n’Abụ Ọma a
Gịnị mere na aha Chineke adịghị n’ọtụtụ Baịbụl ndị mmadụ sụgharịrị? E nwere ihe dị iche iche kpatara ya. Ụfọdụ chere na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekwesịghị inwe aha pụrụ iche a ga na-akpọ ya. Ọ ga-abụ na ihe mere ndị ọzọ edeghị aha Chineke na Baịbụl bụ na ha sooro omenala ndị Juu. Ndị Juu anaghị ekwe akpọ aha Chineke. O nwere ike ịbụ n’ihi na ụjọ na-atụ ha na ha nwere ike imerụ aha ahụ. Ndị ọzọ kwuru na ebe ọ bụ na e nweghị onye ma kpọmkwem otú e si akpọ aha Chineke, ọ ka mma ide aha ndị mmadụ na-etu ya, dị ka “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke.” Ma, ihe ndị a
ha kụdoro aka hapụ ide aha Chineke na Baịbụl enweghị isi. Lee ihe ndị mere anyị ji kwuo otú ahụ:-
Ndị sịrị na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekwesịghị inwe aha pụrụ iche a ga na-akpọ ya leghaara ihe ndị e dere n’akwụkwọ Baịbụl ndị e depụtaghachiri n’oge ochie anya, ma ndị nke dị tupu Kraịst abịa n’ụwa, bụ́ ndị gosiri na aha Chineke gbara na Baịbụl. Dị ka anyị kwuburu, Chineke mere ka e dee aha ya na Baịbụl ihe karịrị ugboro puku asaa (7,000). Nke a gosiri na ọ chọrọ ka anyị mara aha ya, na-akpọkwa ya.
-
Ndị nke sooro omenala ndị Juu hapụ ide aha Chineke na Baịbụl leghaara otu ihe dị ezigbo mkpa anya. Ihe ahụ bụ na n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị Juu bụ́ ndị odeakwụkwọ ekweghị akpọ aha Chineke, ha ewepụghị aha ahụ mgbe ha na-edepụtaghachi Baịbụl. Aha Chineke gbara n’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ mpịakọta oge ochie a hụrụ na Kumran nke dị nso n’Oké Osimiri Nnu. Ụfọdụ ndị na-asụgharị Baịbụl na-ede “ONYENWE ANYỊ” ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo n’ebe e kwesịrị ide aha Chineke. Ihe a ha na-eme gosiri na aha Chineke dị n’ebe ndị ahụ mgbe e dere Baịbụl. Ma ajụjụ bụzi, Gịnị mere ha ji wepụ aha Chineke ma ọ bụ jiri ihe ọzọ dochie ya ebe ọ bụ na ha ma na aha ahụ gbara ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl? Ònye ka ha chere nyere ha ikike iwepụ aha ahụ ma ọ bụ iji ihe ọzọ dochie ya? Ọ bụ hanwa ma.
-
Ndị nke na-edenyeghị aha Chineke na Baịbụl maka na ha sịrị na e nweghị onye ma kpọmkwem otú e si akpọ ya denyere aha Jizọs. Ma, otú ọtụtụ Ndị Kraịst si akpọ ya taa dị nnọọ iche n’otú ndị mbụ soro ụzọ ya si kpọọ ya. O nwere ike ịbụ na otú ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst si akpọ Jizọs bụ Ye·shuʹa‛. Otú ha si akpọ utu aha ya bụ́ “Kraịst” bụ Ma·shiʹach ma ọ bụ “Mezaya.” Ndị Kraịst na-asụ Grik na-akpọ ya I·e·sousʹ Khri·stosʹ, ebe ndị nke na-asụ Latịn na-akpọ ya Ieʹsus Chriʹstus. Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik dee aha Jizọs otú e si akpọ ya n’asụsụ Grik. Ihe a Ndị Kraịst oge mbụ mere gosiri na ha ma ihe n’ihi na ha dere aha Jizọs otú ọtụtụ ndị na-asụ Grik si akpọ ya. Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mekwara ụdị ihe ahụ. Ha sụgharịrị aha Chineke “Jehova” n’ihi na ha ghọtara na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime n’agbanyeghị na o nwere ike ọ bụghị otú ahụ ka ndị Hibru oge ochie si akpọ ya.
Gịnị mere e ji sụgharịa aha Chineke “Jehova” ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ? N’asụsụ Igbo, otú e si ede mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ a na-akpọ Tetragramatọn (יהוה) bụ YHWH. Ndị Hibru anaghị etinye ụdaume n’okwu ọ bụla ha na-ede, ọ bụ ya mere na ụdaume adịghị na Tetragramatọn. Mgbe ndị mmadụ ka na-asụ asụsụ Hibru a na-asụ n’oge ochie, ọ na-abụ ha gụwa ihe e dere n’asụsụ Hibru, ha ejiri aka ha tinye ụdaume dabara adaba.
Jenesis 13:4; Ọpụpụ 3:15) Ihe anyị ma bụ na Chineke kpọrọ aha ya ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-agwa ndị fere ya okwu, anyị makwa na ndị fere ya na-akpọ ya aha ya ahụ nakwa na ha na-akpọ aha ya mgbe ha na-agwa ndị ọzọ okwu.—Ọpụpụ 6:2; 1 Ndị Eze 8:23; Abụ Ọma 99:9.
Ihe dị ka otu puku afọ e dechara Akwụkwọ Nsọ Hibru, ndị ọkachamara bụ́ ndị Juu bidoro tinyewe akara ga-eme ka ndị na-agụ Hibru mara ụdaume nke ha kwesịrị itinye ma ha gụwa ihe. Ma n’oge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ebidola iche na mmadụ ịkpọ aha Chineke bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, ha na-akpọ Chineke ihe ndị ọzọ na-abụghị ezigbo aha ya. Ọ dị ka ọ̀ na-abụ ha dewe aha Chineke, ha ewere ụdaume dị n’ihe ndị ọzọ ahụ ha na-akpọ ya tinye ná mkpụrụ akwụkwọ anọ ahụ bụ́ ezigbo aha ya. N’ihi ya, akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ e dere aha Chineke otú ahụ anaghị egosi otú e sibu akpọ aha Chineke n’asụsụ Hibru. Ụfọdụ ndị chere na otú e si akpọ aha Chineke bụ “Yahweh.” E nwekwara ụzọ ndị ọzọ ndị mmadụ kwuru e si akpọ ya. N’otu n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu, e nwere ebe e dere ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Levitikọs n’asụsụ Grik. N’ebe ahụ, otú e si dee aha Chineke bụ Iao. Ụfọdụ ndị Grik dere akwụkwọ n’oge ochie kwukwara na otú ọzọ e si akpọ aha Chineke bụ Iae, I·a·beʹ, nakwa I·a·ou·eʹ. Ma, mmadụ ekwesịghị isiwe ọnwụ na ọ bụ otú a ma ọ bụ otú a ka e si akpọ aha Chineke. Anyị amaghị otú ndị fere Chineke n’oge ochie si akpọ aha Chineke n’asụsụ Hibru. (Ma gịnị mere ndị sụgharịrị Baịbụl a ji dee aha Chineke “Jehova”? Ọ bụ maka na ọ dịla ezigbo anya a kpọwara Chineke “Jehovah” n’asụsụ Bekee nakwa “Jehova” n’asụsụ Igbo.
Ebe aha Chineke gbara na Jenesis 15:2 na Pentatuk Wiliam Tindel sụgharịrị n’afọ 1530
Oge mbụ e dere aha Chineke na Baịbụl Bekee bụ n’afọ 1530. Ọ bụ Wiliam Tindel dere aha a n’akwụkwọ Jenesis ruo Diuterọnọmi ọ sụgharịrị. A na-akpọ akwụkwọ ise a Pentatuk. Otú o si dee aha Chineke bụ “Iehouah.” Ma ka oge na-aga, asụsụ Bekee gbanwere. N’ihi ya, a gbanwekwara otú e si asụpe aha Chineke. Dị ka ihe atụ,
n’afọ 1612, Henri Enswọt dere aha Chineke “Iehovah” n’ebe niile aha ahụ gbara n’akwụkwọ Abụ Ọma ọ sụgharịrị. N’afọ 1639, mgbe e dezigharịrị ihe n’akwụkwọ Abụ Ọma ahụ ma bipụta ya na Pentatuk, otú e sizi dee aha Chineke na ya bụ “Jehovah.” N’afọ 1901, ndị sụgharịrị Baịbụl Bekee a na-akpọ American Standard Version dere “Jehovah” na Baịbụl ahụ n’ebe dị iche iche aha Chineke gbara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.Otu ọkachamara a na-akwanyere ùgwù aha ya bụ Joseph Bryant Rotherham dere aha Chineke “Jehovah” n’akwụkwọ o bipụtara n’afọ 1911, nke a kpọrọ Studies in the Psalms. O kwuru na ihe mere o ji dee ya “Jehovah” kama ide ya “Yahweh” bụ na ya chọrọ ide “aha ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl ma (nke ha nabatara nke ọma).” N’afọ 1930, otu ọkachamara aha ya bụ A. F. Kirkpatrick kwukwara ụdị ihe ahụ mgbe ọ na-akọwa ihe mere o ji dee aha Chineke “Jehovah.” Ọ sịrị: “N’oge a, ndị ọkachamara n’ihe gbasara asụsụ na-asị na otú e kwesịrị isi na-akpọ aha Chineke bụ Yahveh ma ọ bụ Yahaveh. Ma o yiri ka ọ̀ bụ JEHOVAH ka ndị na-asụ Bekee ma kemgbe. Ihe dị mkpa abụghị otú e si akpọ ya kpọmkwem, kama ọ bụ ịghọta na ọ bụ ezigbo aha Chineke, ọ bụghị utu aha nkịtị, dị ka ‘Onyenwe anyị.’”
Mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ a na-akpọ Tetragramatọn, ya bụ, YHWH. Ihe ọ pụtara bụ: “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ”
HWH pụtara: “ịbụ”
Gịnị ka aha a bụ́ Jehova pụtara? N’asụsụ Hibru, aha a bụ́ Jehova si n’okwu Hibru nke pụtara “ịbụ.” N’ihi ya, Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ghọtara na aha Chineke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ụfọdụ ndị ọkachamara kwetara na ọ bụ ihe ọ pụtara, ma ụfọdụ ekwetaghị. N’ihi ya, anyị anaghị esi ọnwụ na ọ bụ naanị ihe a ka aha ahụ pụtara. Ma ihe a kọmitii ahụ ghọtara dabara adaba n’ihi na ọ bụ Jehova bụ Onye kere ihe niile, ọ na-emezukwa ihe ọ bụla o kpebiri ime. Ma, ọrụ Jehova rụrụ abụghị naanị ike eluigwe na ụwa nakwa ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ, ọ ka na-emekwa ka uche ya na ihe ndị o kpebiri mezuo.
N’ihi ya, ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara abụghị naanị ihe e kwuru n’Ọpụpụ 3:14, ya bụ: “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ” ma ọ bụ “M Ga-abụ Ihe M Họọrọ Ịbụ.” Ma nke bụ́ eziokwu bụ na okwu ndị a akọwachaghị ihe aha Chineke pụtara. Kama, ha mere ka anyị mata otu ihe gbasara Chineke, ya bụ, na ọ na-abụ ihe ọ bụla o kwesịrị ịbụ n’oge ọ bụla ka o wee mezuo uche ya. Ọ bụ eziokwu na ihe a nwere ike iso n’ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara, ma ọ bụghị naanị ya ka ọ pụtara. Ọ pụtakwara na ọ na-eme ka ihe o kere eke bụrụ ihe ọ chọrọ ka o wee mezuo uche ya.