Abụ Ọma 71:1-24
71 Jehova, agbabala m n’ime gị.
Biko, ekwela ka ihere mee m.+
2 Zọpụta m ma napụta m n’ihi na ị bụ onye ezi omume.
Gee m ntị* ma zọpụta m.+
3 Ghọọrọ m ebe a rụsiri ike n’oké nkume,Bụ́ ebe m ga na-agbaba mgbe niile.
Biko, nye iwu ka a zọpụta m,N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike.+
4 Chineke m, biko, napụta m n’aka onye ajọ omume,+N’aka onye na-emegbu m n’enweghị ihe m mere ya.
5 N’ihi na m nwere olileanya n’ebe ị nọ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.
M tụkwasịrị gị obi* kemgbe m bụ nwata.+
6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi kemgbe a mụrụ m.
Ọ bụ gị si n’afọ nne m kupụta m.+
M ga na-eto gị mgbe niile.
7 Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya ma ha hụ ihe ọma meere m.
Ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
8 M ji ọnụ m eto gị mgbe niile.+
Kwa ụbọchị, m na-akọ otú i si dị ebube.
9 Ajụla m mgbe m mere agadi.+
Ahapụla m mgbe ike na-adịghịzi m.+
10 Ndị iro m na-ekwu okwu ọjọọ banyere m,Ndị chọrọ igbu m* na-agbara m izu ọjọọ,+
11 Sị: “Chineke ahapụla ya.
Chụwa ya jide ya, n’ihi na e nweghị onye ga-azọpụta ya.”+
12 Chineke, biko, anọzila m n’ebe dị anya.
Chineke m, biko, bịa ọsọ ọsọ nyere m aka.+
13 Ka ihere mee ndị na-emegide m,*Ka a laakwa ha n’iyi.+
Ka e menye ndị na-achọ ka ọdachi dakwasị m ihere,Ka e mechuokwa ha ihu.+
14 Ma m ga na-echere gị.
M ga-etokwu gị.
15 M ga-eji ọnụ m kọsaa ezi omume ị na-eme.+
Kwa ụbọchị, m ga-akọsa otú i si azọpụta ndị gị,N’agbanyeghị na otú i si azọpụta ha karịrị akarị nke na anaghị m aghọtacha ha.*+
16 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova,M ga-abịa kọọ gbasara ihe ndị dị ukwuu ị na-eme.
M ga-ekwu banyere naanị ezi omume ị na-eme.
17 Chineke, ị na-akụziri m ihe kemgbe m bụ nwata.+
Ruo ugbu a, m ka na-akọ banyere ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ.+
18 Chineke, biko, m megodị agadi gbaa isi awọ́, ahapụla m.+
Biko, ka m kọọrọ ọgbọ na-abịa abịa banyere ike* gị,Kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ihe ndị dị ukwuu ị na-eme.+
19 Chineke, ezi omume ị na-eme karịrị nnọọ akarị.+
I meela ọtụtụ ihe dị egwu.
Chineke, ònye dị ka gị?+
20 N’agbanyeghị na i mere ka m taa nnukwu ahụhụ nakwa ka ọtụtụ nsogbu bịara m,+Mee ka m dị ike ọzọ.
Si n’ala ala mmiri gụpụta m.+
21 Mee ka a na-akwanyekwuru m ùgwù.
Chebe m ma kasie m obi.
22 M ga-ejizi ụbọ akwara too gị,Chineke m, n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
M ga-eji une bụkuo gị abụ otuto,Gị Onye Nsọ Izrel.
23 M ga-eji obi ụtọ bụkuo gị abụ otuto,+N’ihi na ị zọrọ m ndụ.*+
24 Kwa ụbọchị, m ga na-akọ banyere ezi omume ndị ị na-eme,+N’ihi na ihere ga-eme ndị chọrọ ka m laa n’iyi, a ga-emechukwa ha ihu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
^ Ma ọ bụ “Ị bụ obi ike m.”
^ Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “agụtali ha ọnụ.”
^ Na Hibru, “ogwe aka.”
^ Ma ọ bụ “zọpụtara mkpụrụ obi m.”