Abụ Ọma 41:1-13

  • Ekpere onye na-arịa ọrịa kpere

    • Chineke na-enyere onye ọrịa aka (3)

    • Ezigbo enyi ya gbara ya mgba okpuru (9)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 41  Onye na-emetere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere na-enwe obi ụtọ.+ Jehova ga-anapụta ya n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya.   Jehova ga-echebe ya ma dowe ya ndụ. A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa.+ Ị gaghị ahapụ ya ka ndị iro ya mee ya ihe ha bu n’obi.+   Jehova ga-enyere ya aka mgbe o dina n’àkwà* ya na-arịa ọrịa.+ Ị ga-elekọta ya* n’oge ọ na-arịa ọrịa.   N’ihi na m kwuru, sị: “Jehova, biko, meere m amara.+ Gwọọ m,*+ n’ihi na emehiela m gị.”+   Ma ndị iro m na-ekwu ihe ọjọọ banyere m, sị: “Olee mgbe ọ ga-anwụ, ka e wee chefuo aha ya?”   Ọ bụrụ na otu onye n’ime ha abịa ịhụ m, ọ* na-aghara m ụgha. Ọ na-achọta ihe ọjọọ ọ ga-ekwu. Ya pụzie, ya akọsawa ya.   Ndị niile kpọrọ m asị na-agbanyere ibe ha izu. Ha na-akpa nkata ihe ọjọọ ha ga-eme m. Ha na-asị:   “Ihe ọjọọ abịarala ya. Ugbu a o dinazi edina, ọ gaghị ebili ọzọ.”+   Onye mụ na ya dịdị ná mma, onye m tụkwasịrị obi,+Onye na-eri nri m, na-emegidezi m.*+ 10  Ma, Jehova, biko, meere m amara ma kulite m,Ka m wee kwụọ ha ụgwọ ihe ha mere. 11  Mgbe m ga-amara na ihe m na-eme dị gị mmaBụ mgbe onye iro m na-enweghịzi ike ịṅụrị ọṅụ na ya emeriela m.+ 12  Ma ị na-akwado m maka na m kwụsiri ike n’ebe ị nọ.+ Ị ga-eme ka m nọrọ n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi.+ 13  Ka a na-eto Jehova bụ́ Chineke IzrelRuo mgbe ebighị ebi.*+ Amen na Amen.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “ga-agbanwe ihe ndina ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “obi ya.”
Na Hibru, “eweliela ikiri ụkwụ ya ka o megide m.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”