Abụ Ọma 57:1-11
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.* Ọ bụrụ abụ a mgbe ọ gbagara n’ọgba n’ihi Sọl.+
57 Chineke, meere m amara. Biko, meere m amara,N’ihi na m gbabala* n’ime gị,+M ga-ezokwa n’okpuru nku gị ruo mgbe nsogbu gafere.+
2 Ana m akpọku Chineke Onye Kacha Elu,Ezi Chineke, onye na-eme ka nsogbu m kwụsị.
3 Ọ ga-esi n’eluigwe nyere m aka ma zọpụta m.+
Ọ ga-emegharị onye na-alụso m ọgụ anya. (Sila)
Chineke ga-esi otú ahụ nyere m aka n’ihi na ọ hụrụ m n’anya nakwa n’ihi na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
4 Ndị yiri ọdụm gbara m* gburugburu.+
Ọ bụ n’etiti ndị chọrọ ịdọri m ka m na-edina,Ndị ezé ha dị ka ube na akụ́,Ndị ire ha dịkwa ka mma agha dị nkọ.+
5 Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe.
Ka e too gị n’ụwa niile.+
6 Ha ejirila ụgbụ siere ụkwụ m ọnyà.+
Ahụhụ emeela ka ike gwụ m.*+
Ha egwuola olulu n’ebe m si aga,Ma ọ bụ ha dabara n’ime ya.+ (Sila)
7 Obi siri m ike, Chineke.+
Obi siri m ike.
M ga-akpọrọ gị egwú, bụọkwara gị abụ otuto.
8 Obi* m, teta.
Ụbọ akwara, teta. Tetakwa, gị une.
M ga-ebili n’isi ụtụtụ.+
9 Jehova, m ga-anọ n’ihu ndị obodo dị iche iche too gị.+
M ga-abụku gị abụ otuto ná mba dị iche iche.+
10 N’ihi na ịhụnanya gị* dị ukwuu nke na ọ na-eru n’eluigwe,+Ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.*
11 Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe.
Ka e too gị n’ụwa niile.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m agbabala.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Na Hibru, “Ebube.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Na Hibru, “ruo na mbara igwe.”