Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

  A2

Ihe Ndị E Degharịrị na Baịbụl A

E wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Bekee n’afọ 1950. N’afọ 1961, e wepụtaziri Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik n’asụsụ Bekee. Kemgbe ahụ, ọtụtụ nde mmadụ agụọla Baịbụl a n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri asatọ (180). Baịbụl a abaarala ha uru n’ihi na ọ bụ ihe dị na Baịbụl mgbe e dere ya n’asụsụ Hibru, Arameik, na Grik ka a sụgharịrị na ya, ọ dịkwa mfe ọgụgụ. N’afọ 2001, e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Igbo. E wepụtakwara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik n’asụsụ Igbo n’afọ 2007.

Ma ka afọ na-aga, asụsụ na-agbanwe. Ndị so na Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’oge a chọpụtara na e kwesịrị ịgbanwetụ ihe ụfọdụ na Baịbụl a ka o nwee ike ịna-eru ndị na-agụ ya n’oge a n’obi. N’ihi ya, a gbanwere ihe ụfọdụ na nke Bekee, deziekwa ihe ụfọdụ na ya. E mekwara otú ahụ na nke Igbo. Ihe a bụ ụfọdụ n’ime ha:

  • E dere okwu ndị dị na ya otú e si ekwu okwu n’oge a nakwa otú ka mfe nghọta. Dị ka ihe atụ, mmadụ nụ “ogologo ntachi obi,” o nwere ike ichewe otú mmadụ ga-atachiru obi tupu ya abụrụ na o nweela “ogologo ntachi obi.” Ma ihe e bu n’obi bụ mmadụ ịma ụma jide onwe ya. N’ihi ya, ọ ka mma ide ya “ndidi.” (Ndị Galeshia 5:22) A gbanwere “ndị ikom” na “ndị inyom” ka ha bụrụzie “ụmụ nwoke” na “ụmụ nwaanyị” n’ihi na ọtụtụ ndị anaghịzi ekwu ha otú ahụ. (Ọpụpụ 35:22) A gbanwekwara “àjà ihe ọṅụṅụ” ka ọ bụrụ “àjà mmanya.” (Ọnụ Ọgụgụ 15:5; Ndị Filipaị 2:17) Mgbe a na-edegharị Baịbụl a, a gbanwere “omume rụrụ arụ” n’ebe ụfọdụ ka ọ bụrụ “ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,” gbanwee “ndọrọ ndọrọ” ka ọ bụrụ “ndị kwe na ndị ekweghị.” (Ndị Galeshia 5:19-21) Ihe a sụgharịrị “mgbe a na-akaghị aka” bụzi “mgbe ebighị ebi,” “mgbe niile,” “ga-adịte aka,” ma ọ bụ “ga-adịgide adịgide” n’ihi ihe ọ pụtara n’ebe ọ bụla ọ gbara.—Jenesis 48:4; Ọpụpụ 12:14; 31:16; Levitikọs 7:34.

    N’asụsụ Hibru na Grik a na-asụ n’oge ochie, okwu bụ́ “mkpụrụ” nwere ike ịpụta mkpụrụ akụ́kụ́ ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụkwanụ ọbara ọcha nwoke. Ma ebe ọ bụ na ndị Igbo anaghị ekwukarị “mkpụrụ” mgbe ha na-ekwu gbasara mmadụ, a sụgharịrị ya ihe ọ pụtara n’ebe ọ bụla ọ gbara. (Jenesis 1:11; 22:17; 48:4; Matiu 22:24; Jọn 8:37) N’ọtụtụ ebe, a sụgharịrị ya “nwa” mgbe  a na-ekwu banyere nkwa ahụ e kwere n’Iden, nke dị na Jenesis 3:15.

    Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ, a kpọrọ ihe ndị na-ekpere arụsị ji efe chi ha “ogwe osisi dị nsọ.” Ọ bụ eziokwu na ndị ahụ na-efe arụsị weere “ogwe osisi” ndị ahụ ka ihe dị nsọ, ma mmadụ nwere ike iche na osisi ndị ahụ dị nsọ n’eziokwu. N’ihi ya, e degharịrị ya ugbu a ka ọ bụrụ “ogwe osisi arụsị.”—Ọpụpụ 34:13; Diuterọnọmi 7:5.

  • E mere ka okwu ndị dị na Baịbụl dokwuo anya. Ọtụtụ mgbe, a na-akọwa okwu ụfọdụ gbara ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ akọwa tupu a ghọta ha. Dị ka ihe atụ, n’ebe ọ bụla e kwuru gbasara ili, ya bụ, ili nke na-abụghị ili nkịtị, ihe e dere na ya bụ okwu Hibru bụ́ “Shiol” ma ọ bụ okwu Grik bụ́ “Hedis.” Ihe okwu ndị a na-egosi bụ na ndị nwụrụ anwụ adịghịzi ndụ. Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, e nweghịkwa ihe ọ bụla ha na-eme. Ma ọtụtụ ndị amaghị ihe bụ́ “Shiol” na “Hedis.” N’ihi ya, ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke a, a sụgharịrị okwu ndị ahụ “ili” maka na ọ bụ ya ka ndị dere Baịbụl bu n’obi mgbe ha dere okwu ndị ahụ. Ọ bụzi n’ala ala peeji Baịbụl a ka e denyere “Shiol” na “Hedis.”—Abụ Ọma 16:10; Ọrụ Ndịozi 2:27.

    Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ, a sụgharịrị okwu Hibru bụ́ neʹphesh na okwu Grik bụ́ psy·kheʹ “mkpụrụ obi” n’ebe niile ha gbara na Baịbụl. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-aghọtahie ihe bụ́ “mkpụrụ obi,” otú a e si sụgharịa ya bara uru. O nyeere ndị na-agụ Baịbụl aka ileru ebe okwu Hibru na Grik ndị a gbara anya ka ha nwee ike ịghọta ihe dị iche iche ndị si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl bu n’obi mgbe ha dere ha. N’ebe ụfọdụ, ihe okwu ndị ahụ nwere ike ịpụta bụ (1) mmadụ, (2) ndụ mmadụ, (3) ihe ndị e kere eke dị ndụ, (4) agụụ na-agụ mmadụ, ma ọ bụkwanụ ya apụta (5) ndị nwụrụ anwụ. Ma ebe ọ bụ na ọ bụghị ihe ndị a ka ndị Igbo na-akpọkarị “mkpụrụ obi,” e kpebiri ka a sụgharịa okwu Hibru na okwu Grik ahụ ihe nke ọ bụla pụtara n’ebe ọ gbara na Baịbụl. N’ọtụtụ ebe a sụgharịrị ya, e denyere “Ma ọ bụ ‘mkpụrụ obi’” n’ala ala peeji. (Dị ka ihe atụ, gụọ Jenesis 1:20; 2:7; Levitikọs 19:28; Abụ Ọma 3:2; Ilu 16:26; Matiu 6:25.) Ma e dere ya “mkpụrụ obi” n’ụfọdụ abụ ma ọ bụ n’ụfọdụ amaokwu a ma ama, denyezie ebe a kọwakwuru ya ma ọ bụ otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ya n’ala ala peeji.—Diuterọnọmi 6:5; Abụ Ọma 116:7; Ezikiel 18:4; Matiu 22:37.

    Ọ bụkwa otú ahụ ka e mere okwu bụ́ “akụrụ.” E dere ya akụrụ n’ebe niile ọ pụtara ihe dị n’ahụ́ mmadụ. Ma n’ebe ndị ọ na-abụghị ihe dị n’ahụ́ mmadụ ka a na-ekwu, dị ka n’Abụ Ọma 7:9  na 26:2 nakwa ná Mkpughe 2:23, e dere ihe ọ pụtara, ya bụ, ‘ihe dị mmadụ n’ala ala obi’ ma ọ bụ ‘ihe mmadụ na-eche n’ala ala obi ya,’ denyezie “akụrụ” n’ala ala peeji.

    N’asụsụ Hibru na Grik, okwu a sụgharịrị “abụba” nwere ike ịpụta abụba nkịtị ma ọ bụ ihe kacha mma. N’ihi ya, a sụgharịrị ya “abụba” n’ọtụtụ ebe n’ime Baịbụl. Ma, n’ebe ndị ọ na-agaghị edo anya, a sụgharịrị ya otú a ga-aghọta ya nke ọma. E mekwara otu ihe a n’okwu ndị ọzọ, dị ka “ahụ́” na “mpi.” A sụgharịrị ha ihe ha pụtara n’ebe ọ bụla ha gbara na Baịbụl. (Jenesis 45:18; Ekliziastis 5:6; Job 16:15) A kọwara ụfọdụ n’ime okwu ndị a n’isiokwu bụ́ “Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl.”

  • E dere ya otú ọ ga-aka mfe ọgụgụ. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ, a sụgharịrị okwu Hibru ụfọdụ otú ga-egosi na ihe a na-ekwu emechaala ma ọ bụ na ọ ka na-eme eme. Dị ka ihe atụ, e dere okwu bụ́ “wee gaa n’ihu” iji gosi na ihe a na-ekwu ka na-eme eme. E ji okwu bụ́ “aghaghị” gosi na okwu Hibru a sụgharịrị na-egosi na ihe a na-ekwu emeela emee ma ọ bụ na ọ ga-emerịrị. N’ihi ya, okwu bụ́ “wee gaa n’ihu” na “aghaghị” gbara ọtụtụ ugboro na Baịbụl ahụ. Na Baịbụl a e degharịrị edegharị, a sụgharịrị okwu Hibru ndị ahụ otú ga-aka mfe nghọta n’ebe ndị e kwesịrị igosi na ihe a na-ekwu ka na-eme eme ma ọ bụ na ọ na-emebu eme. (Jenesis 3:9; 15:5; 34:1; Ilu 2:4) Ma n’ebe ụfọdụ, e wepụrụ ha ka o wee dịrị onye na-agụ Baịbụl mfe ọgụgụ, ma ọ bụrụhaala na ime otú ahụ emeghị ka ihe Baịbụl na-ekwu gbanwee.

    E kpere ekpere tupu e degharịa ihe niile e degharịrị na Baịbụl a, a kpachapụkwara anya mgbe a na-edegharị ha. A kwanyekwaara ọrụ ọma ndị so na kọmitii mbụ sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ rụrụ ùgwù.

Ihe ndị ọzọ ị ga-ahụ na Baịbụl a e degharịrị edegharị:

E nwere ihe ndị e dere n’ala ala peeji Baịbụl a. Ọ bụ otú a ka e si dee ha:

  • “Ma ọ bụ” Ihe ọ pụtara bụ na ihe e dere n’ala ala peeji bụ otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik e si na ya sụgharịa ihe e dere.—Jenesis 1:2, ihe e dere gbasara “ike Chineke” n’ala ala peeji; Joshụa 6:18, “ọdachi.”

  • “O nwere ike ịbụ” Ihe ọ pụtara bụ na ihe e dere n’ala ala peeji bụ otú ọzọ dịkwa mma e nwere ike isi ghọta ihe a sụgharịrị, n’agbanyeghị na o nwere ike ịdịtụ iche.—Jenesis 21:6, “ga-eso m chịa ọchị”; Zekaraya 14:21, “onye Kenan.”

  •  “Na Hibru,” “Na Grik,” “N’Arameik” Ihe ọ pụtara bụ na ihe e dere n’ala ala peeji bụ otú e si dee ya n’asụsụ Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik ma a sụgharịa ya otu otu ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ihe okwu ahụ pụtara n’asụsụ ahụ.—Jenesis 30:22, “ịdị ime”; Ọpụpụ 32:9, “ndị isi ike.”

  • Ihe okwu pụtara na ihe ndị ọzọ e kwuru gbasara ya E ji ya kọwaa ihe aha dị iche iche pụtara (Jenesis 3:17, “Adam”; Ọpụpụ 15:23, “Mera”). E ji ya kọwakwuo otú ihe dị iche iche hà ma ọ bụ otú ha dịruru n’arọ (Jenesis 6:15, “kubit”). E ji ya kọwaa onye a na-ekwu maka ya (Jenesis 38:5, “Ha”). E jikwa ya gosi na e nwere ihe a kọwakwuru n’azụ Baịbụl.—Jenesis 37:35, “ili”; Matiu 5:22, “Gehena.”

N’ebe ihu Baịbụl a, e nwere isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Na-ekwu.” Ihe e dere na ya bụ isi ihe ndị Baịbụl na-akụzi. Isiokwu ndị sochiri akwụkwọ ikpeazụ dị na Baịbụl a bụ “Akwụkwọ Ndị Dị na Baịbụl,” “Okwu Ndị Dị na Baịbụl,” nakwa “Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl.” “Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl” na-enyere onye na-agụ Baịbụl a aka ịghọta ihe okwu dị iche iche e dere pụtara na Baịbụl. E nwere nkebi a kpọrọ “Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara—Nke A.” Isiokwu ndị dị na ya bụ: “Ihe Ndị E Kwesịrị Iburu n’Uche Mgbe A Na-asụgharị Baịbụl,” “ Ihe Ndị E Degharịrị na Baịbụl A,” “Otú Anyị Si Nweta Baịbụl,” “Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru,” “Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst,” “Chaatị: Ndị Amụma na Ndị Eze E Nwere na Juda Nakwa n’Izrel,” na “Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa.” E nwekwara nkebi ọzọ a kpọrọ “Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara—Nke B.” Ihe ndị dị na ya bụ map, chaatị, na ihe ndị ọzọ ga-abara ndị na-amụ Baịbụl nke ọma uru.

Ná mbido akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla, e depụtara ihe ndị dị n’ime ya nakwa amaokwu ndị ha si. Ihe a ga-enyere onye na-agụ Baịbụl aka ịghọta ihe akwụkwọ nke ọ bụla na-ekwu. N’etiti peeji ọ bụla na Baịbụl a, e dere amaokwu Baịbụl dị iche iche. Ha na-egosi amaokwu ndị gbasara amaokwu ọzọ. E si ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ nweta ha.