“Na-enwe Ndidi”
Mgbakọ Ukwu Ndịàmà Jehova nke Afọ 2023
Anyị na-akpọ gị ka ị bịa mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova ga-enwe n’afọ a. Ọ ga-ewe ụbọchị atọ.
Ị gaghị akwụ ụgwọ iji bata • A gaghịkwa ana gị ego
Ihe Ụfọdụ A Ga-eme ná Mgbakọ A
Nnọkọ Fraịdee: Ị ga-amụta otú inwe ndidi ga-esi nyere gị aka ka i mee ihe ndị ị chọrọ ime mgbe ị na-efe Chineke.
Nnọkọ Satọdee: Olee otú inwe ndidi ga-esi nyere gị aka ka gị na ndị ikwu gị na ndị enyi gị dịkwuo ná mma?
Nnọkọ Sọnde: Ị rịọ Chineke ka o nyere gị aka, gịnị ka i kwesịrị ịtụ anya ya? Okwu isiokwu ya bụ “Chineke Ọ̀ Ga-enyere Gị Aka n’Eziokwu?” ga-aza ajụjụ a.
Lee vidio ndị a gbasara mgbakọ ukwu afọ a
Gịnị Ka Anyị Na-eme ná Mgbakọ Ukwu Anyị?
Chọpụta ihe ị ga-ahụ ná mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova.
Mgbakọ Ukwu Ndịàmà Jehova nke Afọ 2023: “Na-enwe Ndidi”
Gịnị mere isiokwu mgbakọ ukwu nke afọ a ji dị ezigbo mkpa n’oge a?
Ihe Ụfọdụ Si n’Ihe Nkiri Bụ́ “Kwe Ka Jehova Na-edu Gị”
Amani na ndị ezinụlọ ya ga-agbapụrịrị ka a ghara igbu ha. Hà ga-atụkwasị onwe ha obi ka hà ga-echere ka Chineke ha chebe ha?