Abụ Ọma 47:1-9

  • Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile

    • ‘Jehova dị egwu’ (2)

    • Bụkuonụ Chineke abụ otuto (6, 7)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+ 47  Unu ndị niile, kụọnụ aka. Toonụ Chineke, tiekwanụ mkpu ọṅụ.  2  N’ihi na Jehova, Onye Kacha Elu, dị egwu.+ Ọ bụ nnukwu Eze nke na-achị ụwa niile.+  3  Ọ na-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru anyị. Ọ na-eme ka anyị merie mba dị iche iche.+  4  Ọ bụ ya na-ahọtara anyị ebe anyị ga-eketa,+Bụ́ ebe Jekọb, onye ọ hụrụ n’anya, ji anya isi.+ (Sila)  5  Chineke agbagorola mgbe ndị mmadụ na-eti mkpu ọṅụ. Jehova agbagorola mgbe a na-afụ opi.*  6  Bụkuonụ Chineke abụ otuto. Bụọnụ abụ otuto. Bụkuonụ Eze anyị abụ otuto. Bụọnụ abụ otuto.  7  N’ihi na Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile.+ Bụkuonụ ya abụ otuto. Gosinụ na unu ma ihe.  8  Chineke aghọọla Eze na-achị mba niile.+ Chineke nọ n’ocheeze ya dị nsọ.  9  Ndị isi nke ndị dị iche icheNa ndị nke Chineke Ebreham ezukọtala. N’ihi na ọ bụ Chineke nwe ndị na-achị achị n’ụwa.* Ọ nọ n’ebe dị ezigbo elu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mpi ebule.”
Na Hibru, “ọta niile nke ụwa.”