Abụ Ọma 133:1-3
Abụ Mgbago. Abụ Devid.
133 Ọ bụ ihe dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọMa ụmụnne bikọta ọnụ ma dịrị n’otu.+
2 Ọ dị ka ezigbo mmanụ+A wụsara n’isi Erọn,Nke na-eruda n’afụ ọnụ ya,+Na-erudakwa n’olu uwe ya.
3 Ọ dị ka igirigi nke na-ada na Hemọn,+Nke na-ada n’ugwu ndị dị na Zayọn.+
Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova kwere nkwa na ya ga-agọzi ndị ya,Nye ha ndụ ebighị ebi.