Abụ Ọma 51:1-19

  • Ekpere onye chegharịrị echegharị kpere

    • M si n’afọ bụrụ onye mmehie (5)

    • “Sachapụ mmehie m” (7)

    • “Mee ka m nwee obi dị ọcha” (10)

    • Chineke na-anabata onye ihe o mere na-ewute (17)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid bụrụ mgbe Netan onye amụma gwachara ya okwu maka iko ya na Bat-shiba kwara.+ 51  Chineke, biko, meere m amara n’ihi ịhụnanya gị.*+ Hichapụ mmehie m n’ihi na ebere gị dị ukwuu.+   Gbaghara m mmehie m,*+Sachapụkwa m mmehie m.+   N’ihi na m ma nke ọma na m mere mmehie,M na-echetakwa mmehie m mgbe niile.+   Ọ bụ gị ka m kacha mehie.+ M meela ihe dị njọ n’anya gị.+ N’ihi ya, ị bụ onye ezi omume ma i kwuo okwu,A gaghịkwa ata gị ụta mgbe ị na-ekpe ikpe.+   Lee, m bu mmehie pụta ụwa. Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m dị ime m.+   Ihe na-amasị gị bụ obi mmadụ ịdị ọcha.+ Kụziere m ihe, ka ihe m na-eche n’ime ime obi m gosi na m ma ihe.   Jiri ùkwù ahịhịa hisop sachapụ mmehie m ka m dị ọcha.+ Sachaa m, ka m dị ọcha karịa snoo.+   Mee ka m na-aṅụrị ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ,Ka ọkpụkpụ m ndị i gwepịara wee ṅụrịa ọṅụ.+   Elezila mmehie m anya,+Hichapụkwa ihe ọjọọ niile m mere.+ 10  Chineke, biko, mee ka m nwee obi dị ọcha,+Meekwa ka ọ na-agụ m agụụ ime ihe dị mma+ mgbe niile. 11  Achụpụla m n’ihu gị. Anapụkwala m mmụọ nsọ gị. 12  Mee ka obi dịghachi m ụtọ otú ọ dị m mgbe ị zọpụtara m.+ Mee ka irubere gị isi na-agụ m agụụ. 13  M ga-akụziri ndị na-eme mmehie ụzọ gị,+Ka ndị mmehie wee lọghachikwute gị. 14  Chineke, bụ́ Chineke na-azọpụta m,+ biko, napụta m ka ikpe ọbara ghara ịma m,+Ka m* wee jiri ọṅụ na-akọsa ezi omume gị.+ 15  Jehova, biko, meghee ọnụ m,Ka m wee jiri ya too gị.+ 16  N’ihi na ọ bụghị àjà ka ị chọrọ. Ọ bụrụ ya ka ị chọrọ, m gaara achụrụ gị ya.+ Ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ na-amasị gị.+ 17  Àjà Chineke na-anabata bụ ihe mmadụ mere iwute ya n’obi. Chineke, ị gaghị eleghara onye obi gbawara anya nakwa onye ihe o mere na-ewute.+ 18  Meere Zayọn ihe ọma. Rụghachi mgbidi Jeruselem. 19  Mgbe ahụ, àjà ndị ezi omume na-achụ ga-amasị gị,Ma àjà dị iche iche a na-esu ọkụ ma àjà ndị a na-esucha ọkụ. A ga-ejizi ọtụtụ oké ehi chụọ àjà n’ebe ịchụàjà gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “Sachapụ m mmehie m nke ọma.”
Na Hibru, “ire m.”