Abụ Ọma 9:1-20
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Mọt-laben.* Abụ Devid.
א [Alef]
9 Jehova, m ga-eji obi m niile too gị.
M ga-akọsa ọrụ niile dị ebube ị na-arụ.+
2 M ga-aṅụrị ọṅụ ma nwee obi ụtọ n’ihi gị.
Gị Onye Kacha Elu, m ga-abụ abụ iji too aha gị.+
ב [Bet]
3 Mgbe ndị iro m na-alaghachi azụ,+Ha ga-ada n’ihu gị, e bibiekwa ha.
4 N’ihi na ị na-ekpechite ọnụ m ka e wee kpee m ikpe ziri ezi.
Ị nọ ọdụ n’ocheeze gị na-ekpe ikpe ziri ezi.+
ג [Gimel]
5 Ị baarala mba dị iche iche mba,+ bibiekwa ndị ajọ omume,Wee hichapụ aha ha ruo mgbe niile ebighị ebi.
6 E bibiela onye iro ruo mgbe ebighị ebi.
I bibiri obodo ha,A gaghịkwa echeta ha ọzọ.+
ה [Hee]
7 Ma Jehova ga-anọ n’ocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi.+
Ọ nọrọla n’ocheeze ya ka o kpee ikpe ziri ezi.+
8 Ọ ga-ekpe ụwa* ikpe ziri ezi.+
Ọ ga-ekpere mba dị iche iche ikpe ziri ezi.+
ו [Wọọ]
9 Jehova ga-abụrụ ndị a na-emegbu emegbu ebe ha ga-agbaba, aka aghara ịkpa ha,+Ebe ndị nọ ná nsogbu ga-agbaba.+
10 Ndị ma aha gị ga-atụkwasị gị obi.+
Jehova, ị gaghị ahapụ ndị na-achọ gị.+
ז [Zayin]
11 Bụkuonụ Jehova, onye bi na Zayọn, abụ otuto.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
12 N’ihi na ọ ga-echeta ndị na-ata ahụhụ ma bọọ ọbọ ọbara ha.+
Ọ gaghị echefu ákwá ha na-ebe.+
ח [Het]
13 Jehova, biko, meere m amara; hụrụ otú ndị kpọrọ m asị si na-emesi m ike,Gị onye si n’ọnụ ọnwụ kpọpụta m,+
14 Ka m wee nọrọ n’ọnụ ụzọ ámá Zayọn*+ kọsaa ọrụ ọma niile ị na-arụMa ṅụrịa ọṅụ maka na ị na-azọpụta m.+
ט [Tet]
15 Mba dị iche iche adabala n’olulu ha gwuru.
Ụgbụ ha ji sie ọnyà ejidela ha n’ụkwụ.+
16 Ikpe Jehova na-ekpe emeela ka a mara ya.+
Ihe onye ajọ omume na-eme emeela ka ọnyà ma ya.+
Higeyọn.* (Sila)
י [Yod]
17 Ndị ajọ omume ga-aga n’ili.*
Ọ bụ ebe mba niile chefuru Chineke ga-aga.
18 Ma, a gaghị echefu ndị ogbenye mgbe niile.+
Ihe ndị dị umeala n’obi na-ele anya ya ga-emekwa.+
כ [Kaf]
19 Jehova, biko, bilie. Ekwela ka mmadụ efu merie gị.
Ka e kpee mba dị iche iche ikpe n’ihu gị.+
20 Jehova, biko, mee ka egwu jide ha,+Ka mba dị iche iche mara na ha bụ naanị mmadụ efu. (Sila)
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “ala.”
^ Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.