Abụ Ọma 116:1-19

  • Abụ e ji kelee Chineke

    • “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ?” (12)

    • ‘M ga-aṅụ ihe dị n’iko iji kelee ya’ (13)

    • “M ga-emezu nkwa m kwere Jehova” (14, 18)

    • Ọnwụ ndị na-erubere Jehova isi na-ewute ya (15)

116  M hụrụ Jehova n’anya Maka na ọ na-anụ olu m. Ọ na-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o nyere m aka.+   N’ihi na ọ na-ege m ntị,*+M ga na-akpọkukwa ya n’oge niile m dị ndụ.   Ọnwụ kere m ụdọ gburugburu. Ọ dị m ka à ga-asị na ili* jichiri m.+ Nsogbu zuru m ahụ́, m nọkwa na-eru naanị uju.+   Ma m kpọkuru Jehova, kpọọ aha ya, sị:+ “Jehova, biko, napụta m!”*   Jehova nwere ọmịiko,* bụrụkwa onye ezi omume.+ Chineke anyị na-eme ebere.+   Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+ E mere ka ike gwụ m, ma ọ zọpụtara m.   Ka mkpụrụ obi m* zuo ike ọzọ,N’ihi na Jehova emesola m ihe otú dị mma.   Ị napụtala m* n’aka ọnwụ. I mere ka m kwụsị ibe ákwá, meekwa ka m ghara ịkpọbi ụkwụ.+   M ga-adị ndụ na-efe Jehova.* 10  Ekwuru m okwu maka na m nwere okwukwe.+ E mekpara m ahụ́ nke ukwuu. 11  Ma ụjọ tụrụ m, mụ asị: “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+ 12  Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọMaka ihe ọma niile o meere m? 13  M ga-aṅụ ihe dị n’iko iji kelee ya maka na ọ zọpụtara m,*M ga-akpọkukwa aha Jehova. 14  M ga-emezu nkwa m kwere Jehova. M ga-anọ n’ihu ndị ya niile mezuo ya.+ 15  Ọnwụ ndị na-erubere Jehova isiNa-ewute* ya.+ 16  Jehova, m na-arịọ gị arịrịọN’ihi na abụ m ohu gị. Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị. Ị tọpụla m agbụ e kere m.+ 17  M ga-achụrụ gị àjà ekele.+ M ga-akpọku aha Jehova. 18  M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.+ M ga-anọ n’ihu ndị ya niile mezuo ya,+ 19  N’ogige ụlọ Jehova,+N’ime Jeruselem. Toonụ Jaa!*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ọ na-ehulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “M ga-eje ije n’ihu Jehova n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “M ga-ebuli iko nke nnukwu nzọpụta elu.”
Na Hibru, “Dị oké ọnụ n’anya.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.