Abụ Ọma 60:1-12
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili E Ji Echeta Ihe” kpọọ ya. Miktam.* Abụ Devid. A ga-eji ya na-akụzi ihe. Ọ bụrụ abụ a mgbe ya na ndị Eram-nehareyim na ndị Eram-Zoba lụrụ ọgụ, Joab wee laghachi gbuo ndị Ịdọm dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000) na Ndagwurugwu Nnu.+
60 Chineke, ị jụrụ anyị. Ị chụsasịrị anyị.+
I wesara anyị iwe. Ma ugbu a, nabataghachi anyị.
2 I mere ka ala maa jijiji. I mere ka ọ gbawaa.
Mechie oghere ya niile, n’ihi na ọ na-adakpu n’ime.
3 I mere ka ndị gị taa ahụhụ.
I mere ka anyị ṅụọ mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.+
4 Gosi* ndị na-atụ egwu gị ihe àmàKa ha wee gbalaga ka a ghara ịgbata ha ụta. (Sila)
5 Biko, jiri ike* gị zọpụta anyị ma za anyị,Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya.+
6 Chineke, Onye dị nsọ, ekwuola,* sị:
“M ga-aṅụrị ọṅụ. M ga-ewere Shikem nye ndị m chọrọ ka ọ bụrụ ihe ha ketara.+
M ga-atụkwa Ndagwurugwu Sọkọt atụ̀ nye ndị m chọrọ.+
7 Ọ bụ m nwe Gilied, ọ bụkwa m nwe Manase.+
Ifrem bụ okpu m na-ekpu n’isi.
Juda bụ mkpara na-egosi ikike m nwere.+
8 Moab bụ efere m ji asa ihe.+
M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m n’Ịdọm.+
M ga-eti mkpu ọṅụ maka na m ga-emeri Filistia.”+
9 Ònye ga-eduru m gaa n’obodo a nọchibidoro anọchibido?*
Ònye ga-edu m ruo Ịdọm?+
10 Chineke, ọ́ bụghị gị, onye jụrụ anyị,Chineke anyị, onye na-anaghịzi anọnyere ndị agha anyị ma ha gaa agha?+
11 Napụta anyị n’ahụhụ anyị na-ata,N’ihi na mmadụ ịzọpụta anyị abaghị uru.+
12 Ọ bụ Chineke ga-enye anyị ike,+Ọ ga-azọpịakwa ndị iro anyị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ O nwere ike ịbụ, “I gosila.”
^ Na Hibru, “aka nri.”
^ O nwere ike ịbụ, “Chineke ekwuola n’ebe nsọ ya.”
^ O nwere ike ịbụ, “n’obodo a rụsiri ike.”