Abụ Ọma 50:1-23
Abụ Esaf.+
50 Chi kacha chi niile, bụ́ Jehova,+ ekwuola okwu.
Ọ na-enye iwu ka ndị niile bi n’ụwa gbakọtaMalite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ.
2 Chineke si na Zayọn, bụ́ ebe mma ruru gwụ,+ na-enwu ka ìhè.
3 Chineke anyị ga-abịa. Ọ gaghịzi agbachi nkịtị.+
Nnukwu ọkụ dị n’ihu ya,+Oké ifufe na-efekwa gburugburu ya.+
4 Ọ na-enye iwu ka ndị niile bi n’eluigwe na ndị niile bi n’ụwa gbakọta,+Ka o wee kpee ndị ya ikpe.+ Ọ na-asị:
5 “Kpọkọtara m ndị na-erubere m isi,Ndị mụ na ha gbara ndụ n’ihi àjà a chụrụ.”+
6 Eluigwe na-akọsa ezi omume Chineke,N’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onyeikpe.+ (Sila)
7 “Ndị m, geenụ ntị. M ga-ekwu okwu.
Izrel, m ga-agba akaebe na i mere ihe na-adịghị mma.+
Abụ m Chineke, bụ́ Chineke gị.+
8 Ọ bụghị àjà ndị ị na-achụ mere m ji abara gị mba,Ọ bụghịkwa n’ihi àjà ị na-esucha ọkụ, bụ́ ndị ị na-edowe n’ihu m mgbe niile.+
9 Agaghị m akpụrụ oké ehi n’ụlọ gịMa ọ bụ kpụrụ ewu* n’ogige anụ ụlọ gị.+
10 N’ihi na ọ bụ m nwe ma anụ niile bi n’ọhịa+Ma anụmanụ ndị bi n’ugwu niile.*
11 M ma nnụnụ niile bi n’ugwu.+
Ọ bụ m nwe imirikitiimi anụmanụ bi n’ọhịa.
12 Ọ bụrụ na agụụ agụwa m, agaghị m agwa gị,N’ihi na ọ bụ m nwe ụwa na ihe niile dị na ya.+
13 M̀ ga-eri anụ oké ehiMa ṅụọ ọbara ewu?+
14 Na-ekele Chineke. Ọ bụ ya bụ àjà ị ga-achụrụ ya,+Mezuokwa nkwa i kwere Onye Kacha Elu.+
15 Kpọkuo m n’oge nsogbu.+
M ga-anapụta gị, ị ga-etokwa m.”+
16 Ma Chineke ga-agwa onye ajọ omume, sị:
“Ònye nyere gị ikike ikwu ihe ndị m nyere n’iwu+Ma ọ bụ ikwu banyere ọgbụgba ndụ m?+
17 Ị naghị anabata aka ná ntị a na-adọ gị,*Ị naghịkwa ege ntị n’okwu m.+
18 Ị hụ onye ohi, ị na-akwado ya,*+Gị na ndị na-akwa iko na-akpakwa.
19 Ị na-eji ọnụ gị akọsa ihe ọjọọ.
Ire gị bụ aghụghọ aghụghọ.+
20 Ị na-anọdụ ala na-ekwu okwu ọjọọ banyere nwanne gị.+
Ị na-akọsa ihe ọjọọ nwanne afọ gị mere.*
21 Mgbe i mere ihe ndị a, m gbachiri nkịtị.
I wee chee na m ga-adị ka gị.
Ma m ga-adọ gị aka ná ntị ugbu a.
M ga-ekwu ihe na-adịghị mma i mere.+
22 Biko, unu ndị na-echefu Chineke, chebaranụ ihe a echiche,+Ka m wee ghara ịdọri unu n’enweghị onye ga-anapụta unu.
23 Ọ bụ onye na-ekele m na-eto m. Ekele ya bụ àjà ọ na-achụrụ m.+
Mụnwa bụ́ Chineke ga-azọpụtakwaOnye na-eso ụzọ dị mma.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “mkpi.”
^ Na Hibru, “n’otu puku ugwu.”
^ Ma ọ bụ “ndụmọdụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “ị na-esonyere ya.”
^ Ma ọ bụ “na-akatọ nwanne gị.”