Ncheta Ọnwụ Jizọs
Sọnde, Mach 24, 2024
Otu ugboro n’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova na-echeta ọnwụ Jizọs otú ahụ o nyere anyị iwu ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”—Luk 22:19.
Anyị na-akpọ gị ka ị bịa nnọkọ a.
Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Anyị Banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs
Awa ole ka ọ ga-ewe?
Ọ ga-ewe ihe dị ka otu awa.
Ebee ka a ga-eme ya?
Jụọ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè unu ka ha gwa gị.
M̀ ga-akwụ ụgwọ tupu e kwe ka m bata?
Mba.
À ga-ana ndị bịara nnọkọ ahụ ego?
Mba. Ndịàmà Jehova anaghị ana ndị bịara nnọkọ ha ọ bụla ego.
Olee ụdị uwe m kwesịrị iyi?
E nweghị ụdị uwe pụrụ iche a na-eyi abịa nnọkọ a. Ma, Ndịàmà Jehova na-agba mbọ iso ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara iji ejiji dị mma ma dị ọgọ. (1 Timoti 2:9) Ọ dịghị mkpa ka i yiri uwe dị oké ọnụ ma ọ bụ nke dị oké mma.
Gịnị ka a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs?
A na-eji abụ na ekpere ebido, jirikwa abụ na ekpere mechie. Onyeàmà Jehova na-ekpe ekpere nke ọ bụla. Ihe bụ́ isi a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ikwu okwu ga-akọwa uru ọnwụ Jizọs bara na otú anyị ga-esi rite uru n’ihe a Chineke na Jizọs meere anyị.