Gaa n'Isiokwu

Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova

Ị ga-anọ ebe a mata gbasara ọmụmụ ihe anyị. I nwekwara ike ịnọ ebe a mata nke dị gị nso i nwere ike ịga.

Chọta nke Dị Gị Nso (ga-emepere gị ebe ọzọ ị ga-anọ gụọ ya)

Olee Otú Ọmụmụ Ihe Anyị Na-adị?

Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ ihe ha ugboro abụọ n’izu. (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ọmụmụ ihe ndị a, anyị na-amụ Baịbụl, na-amụkwa otú anyị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwekwara ike ịbịa ha.

Ọmụmụ ihe anyị na-abụkarị ajụjụ na azịza otú ahụ ụmụ akwụkwọ si amụ ihe. Onye ọ bụla nwekwara ike iweli aka zaa ajụjụ. Tupu anyị amalite ọmụmụ ihe anyị, anyị na-abụ abụ ma kpee ekpere. Anyị na-abụkwa abụ ma kpee ekpere tupu anyị emechie.

Ọ bụghị naanị Ndịàmà Jehova na-abịa ọmụmụ ihe anyị. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa ya. A naghị asị ndị mmadụ kwụọ ụgwọ oche, a naghịkwa ebugharị efere onyinye.