Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya?

Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya?

Otú anyị si eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ nnọọ otú Baịbụl kwuru ka e si na-eme ya. A na-akpọkwa ya Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa “oriri nsọ.” (1 Ndị Kọrịnt 11:20; Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ma, ọtụtụ ihe ndị okpukpe ndị ọzọ kweere banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nakwa ihe ndị ha na-eme mgbe ha na-eme ya esighị na Baịbụl.

Ihe mere e ji eme ya

Ihe mere anyị ji eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ iji cheta Jizọs, ya bụ, igosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà ọ chụrụ n’ihi anyị. (Matiu 20:28; 1 Ndị Kọrịnt 11:24) Ọ bụghị ememme nke na-eme ka Chineke meere onye ọ bụla só mee ya amara ma ọ bụ gbaghara ya mmehie ya. Baịbụl na-akụzi na ọ bụ naanị inwe okwukwe na Jizọs ga-eme ka a gbaghara anyị mmehie, ọ bụghị ime ememme okpukpe.Ndị Rom 3:25; 1 Jọn 2:1, 2.

Ugboro ole ka e kwesịrị ịna-eme ya?

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ma o kwughị ugboro ole ha ga na-eme ya. (Luk 22:19) Ụfọdụ ndị chere na e kwesịrị ịna-eme ya kwa ọnwa, ndị ọzọ echee na e kwesịrị ịna-eme ya kwa izu, kwa ụbọchị, ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, ma ọ bụ mgbe ọ bụla mmadụ chere na ọ dị mma ka o mee ya. * Ma, lee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ichebara echiche.

Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụbọchị ndị Juu ji eme Ememme Ngabiga, mechaakwa nwụọ n’ụbọchị ahụ. (Matiu 26:1, 2) E nwere ihe mere o ji mee ya n’ụbọchị ahụ. Baịbụl ji àjà ahụ Jizọs chụrụ tụnyere nwa atụrụ e ji achụ àjà Ememme Ngabiga. (1 Ndị Kọrịnt 5:7, 8) Ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga naanị otu ugboro n’afọ. (Ọpụpụ 12:1-6; Levitikọs 23:5) Ndị Kraịst n’oge ndịozi mekwara Ncheta Ọnwụ Jizọs naanị otu ugboro kwa afọ. * Ọ bụkwa otú ahụ ka Ndịàmà Jehova na-eme.

Ụbọchị na oge e kwesịrị ịna-eme ya

Otú Jizọs si mee Nri Anyasị ya na-enyere anyị aka ịmata ụbọchị, oge nakwa ugboro ole e kwesịrị ịna-eme ya. O mere ya mgbe anyanwụ dachara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33, na kalenda ndị Juu n’oge Jizọs. (Matiu 26:18-20, 26) Anyị na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ahụ kwa afọ, otú ahụ Ndị Kraịst mere n’oge ndịozi Jizọs. *

N’agbanyeghị na abalị iri na anọ nke ọnwa Naịsan afọ 33 bụ ụbọchị Fraịdee, n’afọ ndị ọzọ, ụbọchị ahụ nwere ike ịdanye n’ụbọchị na-abụghị Fraịdee. Otú anyị si amata ụbọchị bụ́ abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan bụ otú ahụ e si agụ ụbọchị n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụghị otú ndị Juu oge a sizi agụ ya. *

Achịcha na mmanya

Ná nri anyasị ahụ, ihe Jizọs nyere ndịozi ya bụ achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara fọrọ mgbe ha richara oriri Ngabiga. (Matiu 26:26-28) N’ihi ya, ihe anyị ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ achịcha na-ekoghị eko ma ọ bụ achịcha a na-etinyeghị ihe ọ bụla nakwa mmanya na-acha ọbara ọbara, nke a na-agwaghị ihe ọ bụla, ọ bụghị mmanya vaịn ọhụrụ na-anaghị egbu egbu ma ọ bụ mmanya e tinyere ihe na-atọ ụtọ.

Ụfọdụ ndị chọọchị na-eji achịcha e tinyere ihe na-eko achịcha eme ya. Ma na Baịbụl, ihe na-eko achịcha na-anọchi anya mmehie nakwa ihe na-emerụ mmadụ. (Luk 12:1; 1 Ndị Kọrịnt 5:6-8; Ndị Galeshia 5:7-9) N’ihi ya, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko, nke a na-etinyeghịkwa ihe ọ bụla kwesịrị ịnọchi anya ahụ́ Kraịst nke na-enweghị mmehie. (1 Pita 2:22) Ihe ọzọ Baịbụl na-akwadoghị bụ iji mmanya vaịn ọhụrụ na-anaghị egbu egbu eme ya kama iji mmanya na-aba n’anya. Ụfọdụ chọọchị na-eme otú ahụ n’ihi na ha na-ekwu na mmadụ ekwesịghị ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya. Ma, ọ bụghị ihe Baịbụl kwuru.1 Timoti 5:23.

Achịcha na mmanya ahụ abụghị ahụ́ na ọbara Jizọs

Achịcha ahụ na-ekoghị eko na mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nọchiri anya ahụ́ Kraịst na ọbara ya. Ha anaghị agbanwe ghọọ ahụ́ na ọbara Jizọs dị ka ụfọdụ na-eche. Lee ihe Baịbụl kwuru mere anyị ji kwuo otú ahụ.

  • Ọ bụrụ na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ṅụọ ọbara ya, ọ pụtara na Jizọs gwara ha ka ha mebie iwu Chineke nyere gbasara iri ọbara. (Jenesis 9:4; Ọrụ Ndịozi 15:28, 29) Ma Jizọs agaghị emeli ụdị ihe a. Ọ gaghị anwa anwa gwa ndị mmadụ ka ha mebie iwu Chineke nyere gbasara ọbara.Jọn 8:28, 29.

  • Ọ bụrụ na ọ bụ ọbara Jizọs ka ndịozi ya ṅụrụ, ọ garaghị asị na “a ga-awụpụ” ọbara ya, nke na-egosi na o jibeghị ọbara ya chụọ àjà mgbe ahụ.Matiu 26:28.

  • Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà “naanị otu ugboro.” (Ndị Hibru 9:25, 26) N’ihi ya, ọ bụrụ na achịcha na mmanya ahụ na-aghọ ahụ́ na ọbara Jizọs mgbe a na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ọ pụtara na ndị na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya ahụ na-achụgharị àjà ahụ Jizọs chụrụla.

  • Jizọs sịrị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m,” ọ bụghị “ka unu wee na-achụ m n’àjà.”1 Ndị Kọrịnt 11:24.

Ihe mere ụfọdụ ndị ji kwere na achịcha na mmanya ahụ na-aghọ ahụ́ na ọbara Jizọs bụ n’ihi otú Baịbụl ụfọdụ si sụgharịa ihe ahụ Jizọs kwuru. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ Baịbụl, e dere na Jizọs kwuru banyere mmanya ahụ, sị: “Nke a bụ ọbara m.” (Matiu 26:28) Ma, otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ihe ahụ Jizọs kwuru bụ “Nke a pụtara ọbara m,” “Nke a nọchiri anya ọbara m,” ma ọ bụ “Nke a bụ ihe e ji dochie anya ọbara m.” * Jizọs ji ihe atụ kwuo okwu mgbe ahụ otú ahụ o si ejikwa ihe atụ akụzi ihe.Matiu 13:34, 35.

Ònye kwesịrị ịta achịcha na ịṅụ mmanya ahụ?

Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova na-eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya ahụ. Maka gịnị?

E ji ọbara Jizọs ji chụọ àjà hiwe “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” nke nọchiri anya ọgbụgba ndụ Jehova Chineke na mba Izrel oge ochie gbara. (Ndị Hibru 8:10-13) Ọ bụ ndị só n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ a na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya ahụ. Ọ bụghị Ndị Kraịst niile so n’ọgbụgba ndụ a. Kama, ọ bụ naanị ndị Chineke “kpọrọ” n’ụzọ pụrụ iche. (Ndị Hibru 9:15; Luk 22:20) Ndị ahụ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. Baịbụl kwukwara na ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ bụ ndị nwere ihe ùgwù a.Luk 22:28-30; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3.

Ma, e wezụga “ìgwè atụrụ nta” ndị ga-eso Kraịst chịa, ọtụtụ n’ime anyị nwere olileanya iso ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Luk 12:32; Mkpughe 7:9, 10) Anyị bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa anaghị ata achịcha e ji echeta ọnwụ Jizọs, anyị anaghịkwa aṅụ mmanya ahụ. Ma, anyị na-eso echeta ọnwụ Jizọs iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà ọ chụrụ n’ihi anyị.1 Jọn 2:2.

^ para. 6 Akwụkwọ a na-akpọ McClintock and Strong’s Cyclopedia, Mpịakọta nke Itoolu, peeji nke 212, kwuru, sị: “Okwu ahụ bụ sakramentị adịghị n’Agba Ọhụrụ; okwu Grik bụ́ μυστήριον [ya bụ, my·steʹri·on], enweghịkwa otú o si gbasa baptizim ma ọ bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla a na-ahụ anya.”

^ para. 7 Gụọ akwụkwọ bụ́ The New Schaff-Herzog Encyclopedia of Religious Knowledge, Mpịakọta nke Anọ, peeji nke 43-44, nakwa McClintock and Strong’s Cyclopedia, Mpịakọta nke Asatọ, peeji nke 836.

^ para. 9 Gụọ akwụkwọ bụ́ The New Cambridge History of the Bible, Mpịakọta nke Mbụ, peeji nke 841.

^ para. 10 Ihe ndị Juu oge a ji ekpebi ụbọchị ọnwa Naịsan malitere bụ mgbe ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na e nweela ọnwa ọhụrụ. Ma, ọ bụghị otú e si amata ya n’oge Jizọs. Kama, n’oge Jizọs, otú e si ekpebi ụbọchị mbụ n’ọnwa bụ ụbọchị mbụ a hụrụ ọnwa ọhụrụ na Jeruselem. O nwere ike ịbụ otu ụbọchị ma ọ bụ karịa ma ndị ọkà mmụta sayensị kwuchaa na e nweela ọnwa ọhụrụ. Ihe a so n’ihe mere na ụbọchị Ndịàmà Jehova ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs ji adị iche mgbe ụfọdụ n’ụbọchị ndị Juu oge a ji eme Ememme Ngabiga.

^ para. 20 Gụọ akwụkwọ ndị a: A New Translation of the Bible, by James Moffatt; The New Testament—A Translation in the Language of the People, by Charles B. Williams; nakwa The Original New Testament, by Hugh J. Schonfield.

GỤKWUO GBASARA YA

“Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”

Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịma gbasara Ememme Ngabiga? Gịnị ka anyị niile nwere ike ịmụta ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”?

Olee otú ihe mgbapụta ahụ si agbapụta ndị mmadụ n’aka mmehie?