Ozi Ọma Luk Dere 22:1-71

  • Ndị isi nchụàjà kpara nkata igbu Jizọs (1-6)

  • A kwadebere Ememme Ngabiga ikpeazụ Jizọs mere (7-13)

  • Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (14-20)

  • “Mụ na onye ga-arara m nye nọ na tebụl a” (21-23)

  • Ndị na-eso ụzọ Jizọs sere ezigbo okwu (24-27)

  • Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gbara ndụ na ha ga-eso ya chịa n’alaeze (28-30)

  • Jizọs kwuru na Pita ga-agọnahụ ya (31-34)

  • Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dị njikere; ha gosiri ya mma agha abụọ (35-38)

  • Ekpere Jizọs kpere n’Ugwu Oliv (39-46)

  • Mgbe e jidere Jizọs (47-53)

  • Pita gọnahụrụ Jizọs (54-62)

  • A kwara Jizọs emo (63-65)

  • Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe na Sanhedrin (66-71)

22  Ma Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, nke a na-akpọ Ememme Ngabiga,+ na-eru nso.+  Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na-atụkwa egwu ndị mmadụ.+ N’ihi ya, ha nọ na-achọ otú kacha mma ha ga-esi gbuo Jizọs.+  Ma Setan banyere n’ime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, onye bụ́kwa otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs.+  O wee gakwuru ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ, ya na ha akpaa otú ọ ga-esi rara ya nye n’aka ha.+  Ihe a mere ha obi ụtọ, ha ekweta inye ya ego ọlaọcha.+  O wee kwere, malitekwa ịchọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye n’aka ha mgbe ìgwè mmadụ na-anọghị ya.  Ụbọchị Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko wee ruo. Ọ bụ ụbọchị a na-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà.+  Jizọs wee gwa Pita na Jọn, sị: “Gaanụ kwadebere anyị nri Ememme Ngabiga ka anyị rie.”+  Ha asị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebe ya?” 10  Ya asị ha: “Mgbe unu banyere Jeruselem, unu ga-ahụ otu nwoke bu udu mmiri. Soronụ ya baa n’ụlọ ọ ga-abanye.+ 11  Sịnụ onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri Ememme Ngabiga?”’ 12  Nwoke ahụ ga-egosi unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu, e doziri edozi. Kwadebenụ ya n’ebe ahụ.” 13  Ha wee gawa hụ ya otú ahụ o si gwa ha. Ha kwadebekwara maka Ememme Ngabiga ahụ. 14  Mgbe oge ruru, ya na ndịozi ya nọdụrụ ala ka ha rie ihe na tebụl.+ 15  O wee sị ha: “Ọ gụsiri m agụụ ike iso unu rie nri Ememme Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ. 16  Ana m asị unu, agaghị m eri ya ọzọ ruo mgbe ihe niile gbasara ya mezuru n’Alaeze Chineke.” 17  Ka ọ naara iko, o kelere Chineke, sị: “Burunụ ya. Onye ṅụrụtụ ihe dị n’ime ya, ya ebunye ibe ya. 18  Ana m asị unu, si ugbu a gawa, agaghị m aṅụ mmanya vaịn ọzọ ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa.” 19  O wekwaara otu ogbe achịcha,+ kelee Chineke, nyawaa ya, were ya nye ha, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m,+ nke m ga-enye n’ihi unu.+ Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”+ 20  O bukwaara iko ahụ mgbe ha richara nri anyasị, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke ga-enwe isi mgbe m wụpụrụ ọbara m n’ihi unu.+ 21  “Ma, mụ na onye ga-arara m nye nọ na tebụl a.+ 22  N’ihi na ihe niile e dere gbasara Nwa nke mmadụ ga-emezu.+ Ma, onye ga-arara ya nye ga-ata ahụhụ.”+ 23  Mgbe ha nụrụ ihe a, ha malitere ịjụ ibe ha onye n’ime ha na-eche ime ụdị ihe a.+ 24  Ma, ha malitere ise ezigbo okwu, na-azọ onye kacha ukwuu n’ime ha.+ 25  Ma ọ sịrị ha: “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, a na-akpọkwa ndị na-achị ha Ndị Ome Mma.+ 26  Ma, unu ekwesịghị ịdị otú ahụ.+ Kama ka onye kacha ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kacha nta,+ ka onye na-edu unu bụrụkwa onye na-eje ozi. 27  N’ihi na olee onye ka ukwuu? Ọ̀ bụ onye na-eri ihe, ka ọ̀ bụ onye na-ebunye ya nri?* Ọ́ bụghị onye na-eri ihe? Ma, ọ bụ m na-ejere unu ozi.+ 28  “N’eziokwu, unu ahapụghị m+ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.+ 29  Mụ na unu na-agbakwa ndụ na unu ga-achị n’alaeze, dịkwa ka mụ na Nna m gbara ndụ,+ 30  ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’Alaeze m,+ nọdụkwa ala n’ocheeze+ na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+ 31  “Saịmọn, Saịmọn, Setan ekwuola na ya chọrọ ịyọcha unu niile ka ọka wit.+ 32  Ma arịọsiela m arịrịọ ike ka ị ghara ịda mbà n’okwukwe.+ Ma, mgbe okwukwe gị siri ike ọzọ, meekwa ka okwukwe ụmụnna gị sie ike.”+ 33  O wee sị ya: “Onyenwe anyị, adị m njikere iso gị gaa mkpọrọ, sorokwa gị nwụọ.”+ 34  Ma ọ sịrị ya: “Pita, ana m asị gị, tupu oké ọkpa akwaa taa, ị ga-ekwu ugboro atọ na ị maghị onye m bụ.”+ 35  Ọ sịkwara ha: “Mgbe m zipụrụ unu, unu agawa n’ejighị obere akpa ego na obere akpa nri na akpụkpọ ụkwụ,+ ò nwere ihe kọrọ unu?” Ha asị ya: “Mba.” 36  Ya asị ha: “Ma ugbu a, ka onye nwere obere akpa ego were ya. Ka onye nwere obere akpa nri were ya. Ka onye na-enweghịkwa mma agha ree uwe elu ya zụta otu. 37  Akwụkwọ Nsọ sịrị: ‘A gụnyere ya ná ndị na-emebi iwu.’+ Ana m asị unu, ihe a bụ gbasara m, ọ ga-emezukwa n’isi m.”+ 38  Ha wee sị ya: “Onyenwe anyị, anyị ji mma agha abụọ.” Ya asị ha: “O zuola.” 39  Mgbe ọ pụrụ, ọ gawara n’Ugwu Oliv otú ọ na-emekarị. Ndị na-eso ụzọ ya sokwaara ya.+ 40  Mgbe ha ruru ebe ahụ, ọ sịrị ha: “Na-ekpenụ ekpere, ka a ghara ịnwata unu.”+ 41  O wee si n’ebe ha nọ pụọ gatụ ntakịrị, gbuo ikpere n’ala malite ikpe ekpere, 42  sị: “Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, ekwela ka m ṅụọ ihe dị n’iko a. Ma, ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.”+ 43  Otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara n’ihu ya wee mee ka obi sie ya ike.+ 44  Ma ebe obi na-erughị ya ala, ọ nọ na-ekpesi ekpere ike.+ Ọsụsọ ya dịkwa ka ọbara, na-atapụsịkwa n’ala. 45  Mgbe o si ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere bilie gakwuru ndị na-eso ụzọ ya, ọ hụrụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ihe na-ewute ha n’obi mere ka ike gwụ ha.+ 46  O wee sị ha: “Gịnị mere unu ji ehi ụra? Bilienụ, na-ekpekwanụ ekpere, ka a ghara ịnwata unu.”+ 47  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ìgwè mmadụ bịara, nwoke ahụ a na-akpọ Judas, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, dukwa ha. O wee bịaruo Jizọs nso ka o susuo ya ọnụ.+ 48  Ma Jizọs sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ arara Nwa nke mmadụ nye?” 49  Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe na-aga ime, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị jiri mma agha lụso ha ọgụ?” 50  Otu onye n’ime ha gbudịrị ohu nnukwu onye nchụàjà mma, bepụ ntị aka nri ya.+ 51  Ma Jizọs sịrị: “O zuolanụ.” O wee bitụ ntị nwoke ahụ aka, gwọọ ya. 52  Jizọs wee gwa ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ na ndị okenye chọ ya bịa ebe ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi?+ 53  Mgbe mụ na unu na-anọ n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị,+ unu ejideghị m.+ Ma, oge a bụ oge unu nakwa oge e nyere ndị nọ n’ọchịchịrị ikike.”+ 54  Ha wee jide ya, kpụrụ ya pụọ,+ kpụbata ya n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà. Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ha.+ 55  Mgbe ha kwanyere ọkụ n’etiti mbara èzí wee nọdụ ala, Pita sokwa ha nọrọ ọdụ ebe ahụ.+ 56  Ma otu nwa agbọghọ na-eje ozi ebe ahụ hụrụ ya ka ọ nọ ọdụ n’akụkụ ọkụ ahụ, wee leruo ya anya, sị: “Ya na nwoke a na-anọkwa.” 57  Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Nwaanyị, amaghị m onye ọ bụ.” 58  Mgbe obere oge gara, onye ọzọ hụrụ ya ma sị: “Ị bụkwa otu n’ime ha.” Ma Pita sịrị: “Nwoke m, ọ bụghị eziokwu.”+ 59  Mgbe ihe dị ka otu awa gara, nwoke ọzọ malitere ikwusi ike, sị: “O doro m anya na ya na nwoke a na-anọ, n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ onye Galili!” 60  Ma Pita sịrị: “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu.” N’otu ntabi anya, ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, oké ọkpa kwara. 61  Onyenwe anyị tụgharịziri legide Pita anya, Pita echeta okwu Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa taa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 62  O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá. 63  Ndị ahụ ji Jizọs malitere ịkwa ya emo,+ na-etikwa ya ihe.+ 64  Mgbe ha kpuchiri ya ihu, ha sịrị ya: “Buo amụma, gwa anyị onye tiri gị ihe.” 65  Ha gwakwara ya ọtụtụ okwu ọjọọ ndị ọzọ iji kwuluo ya. 66  Mgbe chi bọrọ, ìgwè ndị okenye ndị Juu, ma ndị isi nchụàjà ma ndị odeakwụkwọ, zukọtara.+ Ha wee kpụrụ ya banye n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ha, sị ya: 67  “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.”+ Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụgodị na mụ agwa unu, unu agaghị ekwe. 68  Ọ bụrụkwa na mụ ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza. 69  Ma, si ugbu a gawa, Nwa nke mmadụ+ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke dị ike.”+ 70  Ha niile wee sị: “Ị̀ na-ekwu na ị bụ Ọkpara Chineke?” O wee sị ha: “Ọ bụ unu kwuru na m bụ.”* 71  Ha wee sị: “Ọ̀ ka bara uru ịchọwa ndị akaebe ọzọ, n’ihi na anyị anụla ya n’ọnụ ya?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye na-ejere ya ozi.”
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.