Abụ Ọma 33:1-22
33 Unu ndị ezi omume, tienụ mkpu ọṅụ n’ihi Jehova.+
Ọ dị mma ka ndị ezi omume na-eto ya.
2 Jirinụ ụbọ akwara na-ekele Jehova.
Jirinụ ụbọ nwere akwara iri bụkuo ya abụ otuto.
3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ.+
Kpọọnụ ụbọ akwara ka ndị bụ́ aka ochie, tiekwanụ mkpu ọṅụ.
4 N’ihi na okwu Jehova bụ eziokwu,+E nwekwara ike ịtụkwasị ọrụ ya niile obi.
5 Ezi omume na ikpe ziri ezi na-amasị ya.+
Ịhụnanya* Jehova juru ebe niile n’ụwa.+
6 Jehova ji okwu ya kee eluigwe,+Ọ bụkwa ume* si ya n’ọnụ ka o ji kee ihe niile dị n’ime ya.*
7 Ọ na-eme ka mmiri ndị dị n’oké osimiri kwụrụ otu ebe ka mgbidi.+
Ọ na-eme ka mmiri na-ekwo ekwo kworo gaa n’ebe ha na-asọkọta.
8 Ka ndị niile bi n’ụwa tụọ egwu Jehova.+
Ka ndị niile bi n’ụwa sọpụrụ ya.
9 N’ihi na o kwuru ka ihe dị, ihe adị.+
O nyere iwu ka ihe mee, ihe o nyere n’iwu emee.+
10 Jehova aghasaala atụmatụ* mba dị iche iche.+
Ọ kụghasịala ihe ndị si n’ebe dị iche iche bu n’obi ime.+
11 Ma ihe niile Jehova kpebiri ime* agaghị agbanwe ruo mgbe ebighị ebi.+
Ihe ndị o bu n’obi ime na-adịgide malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.
12 Mba nke Jehova bụ Chi ya na-enwe obi ụtọ,+Ya bụ, ndị ọ họọrọ ka ha bụrụ ndị nke ya.+
13 Jehova na-esi n’eluigwe eledata anya.
Ọ na-ahụ mmadụ niile.+
14 Ọ na-esi n’ebe o biEle ndị bi n’ụwa anya.
15 Ọ bụ ya na-akpụ obi mmadụ niile.
Ọ na-enyocha ihe niile ha na-eme.+
16 E nweghị eze a ga-azọpụta maka na o nwere ọtụtụ ndị agha.+
Nnukwu ike dike nwere agaghị azọpụta ya.+
17 Ịtụkwasị obi n’ịnyịnya agaghị eme ka a zọpụta mmadụ.*+
Ọ bụghị nnukwu ike ya ga-eme ka mmadụ gbalaga.
18 Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+Bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya,*
19 Ka o wee napụta ha* n’aka ọnwụMa dowe ha ndụ mgbe ụnwụ dara.+
20 Anyị* na-atụ anya ka Jehova nyere anyị aka.
Ọ bụ ọta anyị na onye na-enyere anyị aka.+
21 Anyị na-enwe obi ụtọ n’ihi Chineke anyị,Maka na anyị tụkwasịrị obi n’aha nsọ ya.+
22 Jehova, biko, gosi anyị na ị hụrụ anyị n’anya,*+Ebe anyị na-echere gị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Ịhụnanya pụrụ iche nke.”
^ Ma ọ bụ “mmụọ.”
^ Ma ọ bụ “kee ìgwè ya niile.” O nwere ike ịbụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando ka a na-ekwu.
^ Ma ọ bụ “ndụmọdụ.”
^ Ma ọ bụ “ndụmọdụ Jehova.”
^ Ma ọ bụ “eme ka mmadụ merie.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi anyị.”
^ Ma ọ bụ “gosi anyị ịhụnanya pụrụ iche.”