Abụ Ọma 49:1-20
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+
49 Unu ndị niile, nụrụnụ ihe a.
Unu ndị niile bi n’ụwa,* geenụ ntị,
2 Ma ndị ukwu ma ndị nta,Ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye.
3 M ga-ekwu ihe gosiri na m ma ihe,Ihe m na-atụgharị n’uche+ ga-egosikwa na m na-aghọta ihe.
4 M ga-aṅa ntị ka m nụrụ ilu.
M ga-akọwa ilu m mgbe m na-akpọ ụbọ akwara.
5 Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’oge nsogbu,+Mgbe ndị chọrọ ịgba m mgba okpuru ji ihe ọjọọ ha na-eme gbaa m gburugburu?
6 Ndị tụkwasịrị obi n’ihe ha nwere,+Ndị jikwa nnukwu akụnụba ha nwere anya isi,+
7 E nweghị onye ọ bụla n’ime ha nwere ike ịgbapụta nwanne yaMa ọ bụ nye Chineke ihe a ga-eji gbapụta ya.+
8 (Ụgwọ a ga-akwụ iji gbapụta ha* dị oké ọnụNke na e nweghị mgbe ha ga-akwụli ya).
9 Ha enweghị ike ịgbapụta nwanne ha ka o wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ghara ịbanye n’olulu.*+
10 Onye ọ bụla na-ahụ na ndị ma ihe na-anwụdị anwụ.
Ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-ala n’iyi,+Ha ga-ahapụkwara ndị ọzọ akụ̀ ha.+
11 Ihe ha chọrọ bụ ka ụlọ ha dịruo mgbe ebighị ebi,Ka ụlọikwuu ha dịrị n’ọgbọ niile.
Ha agụọla ala ha aha ha.
12 Ma n’agbanyeghị na a na-akwanyere mmadụ ùgwù, ọ gaghị adịrị ndụ gawa.+
Ọ kaghị anụmanụ na-anwụ anwụ mma.+
13 Ọ bụ ihe na-eme ndị iberiibe+Na ndị na-eso ha, bụ́ ndị ọnụ ha na-etu na-amasị. (Sila)
14 Ha dị ka atụrụ a ga-egbu egbu. Ha ga-aga n’ili.*
Ọnwụ ga-edu ha otú onye na-azụ atụrụ si edu atụrụ ya.
Ndị ezi omume ga-achị ha+ n’ụtụtụ.
Ha agaghịzi anọ.+
Ha ga-ebizi n’ili*+ kama ibi n’obí eze.+
15 Ma Chineke ga-anapụta m* n’ili.*+
Ọ ga-adọpụta m. (Sila)
16 Egwu atụla gị maka na mmadụ bara ọgaranya,Maka na ọ na-akpatakwu akụ̀ n’ụlọ ya.
17 N’ihi na e nweghị otu mkpụrụ ihe ọ ga-ewere ma ọ nwụọ.+
Akụnụba ya agaghị eso ya banye n’ili.+
18 Ọ na-aja onwe ya* ike n’oge ọ nọ ndụ.+
(Ndị mmadụ na-eto mmadụ mgbe ihe na-agaziri ya.)+
19 Ma n’ikpeazụ, ọ na-anwụ otú nna nna ya hà nwụrụ.
Ha agaghịzi ahụ ìhè ọzọ.
20 Onye ọ bụla na-aghọtaghị ihe a, n’agbanyeghị na a na-akwanyere ya ùgwù,+Akaghị anụmanụ na-anwụ anwụ mma.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “n’oge a.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”