Abụ Ọma 74:1-23

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka Chineke cheta ndị ya

    • O chetara otú Chineke si zọpụta ndị ya (12-17)

    • “Cheta otú onye iro si na-akparị gị” (18)

Maskil.* Abụ Esaf.+ 74  Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?+ Gịnị mere i ji na-ewesa ìgwè atụrụ gị ị na-enye nri iwe dị ọkụ?+   Cheta ndị* ị họọrọ n’oge dị anya gara aga,+Ebo ị gbapụtara ka ọ bụrụ ihe i ketara.+ Cheta Ugwu Zayọn bụ́ ebe i bi.+   Gawa n’ebe ndị e bibiri kpamkpam.+ Onye iro ebibiela ihe niile dị n’ebe nsọ.+   Ndị iro gị na-eti mkpu ọṅụ n’ebe a na-anọ efe gị.*+ Ha egwunyela ọkọlọtọ ha n’ebe ahụ iji gosi na ha emeriela.   Ha dị ka ụmụ nwoke ndị ji anyụike na-egbutusị osisi ndị dị n’oké ọhịa.   Ha ji anyụike na ígwè na-egbujisị ihe niile a tụrụ atụ́ dị na ya.+   Ha gbara ebe nsọ gị ọkụ.+ Ha merụrụ ụlọikwuu a kpọkwasịrị aha gị ma kwatuo ya n’ala.   Ha na ụmụ ha ekwuola n’obi ha, sị: “A ga-agba ebe niile a na-anọ efe Chineke n’ala a ọkụ.”   E nweghịzi ihe àmà anyị na-ahụ. E nweghịzi onye amụma nọnụ,E nweghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị ma mgbe ihe a ga-emeru. 10  Chineke, biko, olee mgbe onye iro ga-akwụsị ịkparị gị?+ Onye iro ọ̀ ga na-ekwutọ aha gị ruo mgbe ebighị ebi?+ 11  Gịnị mere i ji sere aka gị, ya bụ, aka nri gị?+ Wepụta aka gị* bibie ha. 12  Ma Chineke bụ Eze m kemgbe ogologo oge gara aga,Onye na-azọpụta ndị ya n’ebe niile n’ụwa.+ 13  Ị na-eji ike gị enugharị oké osimiri.+ Ị kụpịasịrị isi nnukwu anụ mmiri dị iche iche n’ime mmiri. 14  I gwepịara isi nnukwu anụ mmiri.* I weere ya nye ndị mmadụ, bụ́ ndị bi n’ọzara, ka ha rie. 15  Ị waara mmiri na iyi ụzọ.+ I mere ka osimiri ndị na-asọ asọ kemgbe takọọ.+ 16  Ọ bụ gị nwe ehihie na abalị. Ọ bụ gị kere ìhè na anyanwụ.+ 17  Ọ bụ gị kpaara ụwa ókè ya niile.+ Ọ bụ gị mere ka e nwee ọkọchị na udu mmiri.+ 18  Jehova, biko, cheta otú onye iro si na-akparị gị,Otú ndị nzuzu si na-ekwutọ aha gị.+ 19  Enyefela nduru gị n’aka anụ ọhịa. Echefula ndị gị na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. 20  Cheta ndụ anyị na gị gbara,N’ihi na ndị tigbuo zọgbuo na-ezo n’ebe ọ bụla gbara ọchịchịrị n’ụwa chebiri ndị mmadụ. 21  Ka a ghara imenye onye a na-emegbu emegbu ihere.+ Ka ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya too aha gị.+ 22  Chineke, biko, bilie kpechite ọnụ gị. Cheta otú onye nzuzu si na-akparị gị mgbe niile.+ 23  Echefula ihe ndị iro gị na-ekwu. Mkpọtụ ndị na-enupụrụ gị isi na-eme na-ala elu mgbe niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “nzukọ gị.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ nzukọ gị.”
Ma ọ bụ “Wepụta aka gị n’ime uwe gị.”
Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.