Abụ Ọma 76:1-12

  • Chineke ga-emeri ndị iro Zayọn

    • Chineke na-azọpụta ndị dị umeala n’obi (9)

    • A ga-emenye ndị iro dị mpako ihere (12)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ Esaf.+ Abụ ọma. 76  A ma Chineke ama na Juda.+ Aha ya na-ede ude n’Izrel.+   Ụlọikwuu ya dị na Selem,+O bikwa na Zayọn.+   Ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ gbajisịrị akụ́ ụta na-enwu ọkụ,Ọta na mma agha nakwa ngwá agha.+ (Sila)   Chineke, ị na-enwu ka ìhè.* Ị dị ebube karịa ugwu dị iche iche anụ ọhịa juru.   A nakọrọla ndị dike ihe ha nwere.+ Ụra eburula ha. E nweghị onye ike dị ná ndị agha niile.+   Chineke Jekọb, mba ị baraEmeela ka oké ụra buru ma ịnyịnya ma onye na-agba ụgbọ ịnyịnya.+   Ọ bụ naanị gị bụ onye a na-atụ egwu.+ Ònye ga-eguzoli ma i wee oké iwe?+   I si n’eluigwe kwuo ihe i kpebiri.+ Ndị bi n’ụwa tụrụ egwu wee nọrọ jụụ+   Mgbe Chineke biliri ka o mee ihe o kpebiri,Iji zọpụta ndị niile dị umeala n’obi n’ụwa.+ (Sila) 10  N’ihi na iwe mmadụ ga-eme ka e too gị.+ Ị ga-eme ka ihe ikpeazụ ndị iro gị ga-eji iwe mee mee ka e too gị. 11  Kwenụ Jehova bụ́ Chineke unu nkwa ma mezuo ya.+ Ka ndị niile gbara ya gburugburu tụọ egwu ya ma weta onyinye ha.+ 12  Ọ ga-emenye ndị isi dị mpako ihere. Ọ na-eme ka egwu tụwa ndị eze ụwa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ìhè kpuchiri gị.”