Abụ Ọma 106:1-48

  • Ndị Izrel ejighị ihe e meere ha kpọrọ ihe

    • Ha chefuru ihe ndị Chineke mere (13)

    • Ha toro ihe yiri oké ehi kama ito Chineke (19, 20)

    • Ha enweghị okwukwe ná nkwa Chineke (24)

    • Ha so fee Bel (28)

    • Ha ji ụmụ ha chụọrọ ndị mmụọ ọjọọ àjà (37)

106  Toonụ Jaa!* Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+ Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+  2  Ònye ga-akọsali nnukwu ọrụ niile Jehova na-arụMa ọ bụ kọsaa ihe ọma niile ọ na-eme?+  3  Ndị na-ekpe ikpe ziri ezi,Bụ́ ndị na-eme ihe dị mma mgbe niile, na-enwe obi ụtọ.+  4  Jehova, biko, cheta m mgbe ị na-emere ndị gị amara.+ Lekọta m ma zọpụta m,  5  Ka ihe ọma ị na-emere ndị ị họọrọ wee baara m uru,+Ka m wee soro mba gị ṅụrịa ọṅụ,Ka m wee jiri obi ụtọ soro ndị i ketara too gị.  6  Anyị emehiela otú nna nna anyị hà mehiere.+ Anyị emeela ihe ọjọọ. Anyị akpaala àgwà ọjọọ.+  7  Nna nna anyị hà ejighị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt kpọrọ ihe.* Ha echetaghị ịhụnanya gị nke dị ukwuu,Kama ha nupụrụ isi n’oké osimiri, n’Oké Osimiri Uhie.+  8  Ma ọ zọpụtara ha n’ihi aha ya,+Ka o wee mee ka a mara na ọ dị ike.+  9  Ọ baara Oké Osimiri Uhie mba, ya ataa. O duuru ha si n’ala ala osimiri ahụ gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa.*+ 10  Ọ zọpụtara ha n’aka onye kpọrọ ha asị,+Napụtakwa ha n’aka onye iro.+ 11  Mmiri kpuchiri ndị iro ha. E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ.+ 12  Ha nweziri okwukwe ná nkwa o kwere.+ Ha malitere ịbụ abụ, na-eto ya.+ 13  Ma ha chefuru ihe ndị o mere ngwa ngwa.+ Ha echereghị ka o nye ha ntụziaka. 14  Kama ha nwewere akpịrị ogologo n’ala ịkpa.+ Ha nwara Chineke n’ọzara.+ 15  O nyere ha ihe ha rịọrọ,Ma o mere ka ha malite ịrịa ọrịa ọjọọ nke mere ka ike na-agwụ ha* ma mechaa gbuo ha.+ 16  Ha nweere Mosis anyaụfụ n’ebe ha mara ụlọikwuu. Ha nwekwaara Erọn,+ bụ́ onye nsọ Jehova,+ anyaụfụ. 17  Ala wee meghee loo DetanMa kpuchie ndị ha na Abaịram gbakọtara.+ 18  Ọkụ rere ìgwè mmadụ ahụ. Ọkụ regburu ndị ọjọọ ahụ.+ 19  Ha kpụrụ nwa ehi na Horeb,Kpọọkwara ihe e ji ọla kpụọ isiala.+ 20  Ha fewere ihe yiri oké ehi nke na-ata ahịhịa+Kama ito m. 21  Ha chefuru Chineke,+ Onye Nzọpụta ha,Onye mere ihe ndị dị ịtụnanya n’Ijipt,+ 22  Onye rụrụ ọrụ ndị dị ebube n’ala Ham,+Meekwa ihe ndị dị egwu n’Oké Osimiri Uhie.+ 23  Ọ fọrọ obere ka o nye iwu ka e kpochapụ ha. Ma Mosis, onye ọ họọrọ, rịọrọ ya arịrịọKa ọnụma ya dajụọ.+ 24  Ha wee gosi na e nweghị ihe ha ji ọmarịcha ala ahụ kpọrọ.+ Ha enweghị okwukwe ná nkwa ya.+ 25  Ha nọ na-atamu ntamu n’ụlọikwuu ha.+ Ha egeghị ntị n’olu Jehova.+ 26  N’ihi ya, o weliri aka ṅụọ iyiNa ya ga-eme ka ha nwụọ n’ala ịkpa.+ 27  Ọ ga-eme ka ụmụ ha nwụọ ná mba dị iche iche,Ọ ga-achụgakwa ha n’ala dị iche iche.+ 28  Ha wee soro fee Bel nke Piọ,+Ha rikwara ihe a chụụrụ ndị nwụrụ anwụ n’àjà.* 29  Àgwà ha kpasuru Chineke iwe.+ Ọrịa ọjọọ wee malite ịrịa ha.+ 30  Ma mgbe Finihas biliri mee ihe,Ọrịa ọjọọ ahụ kwụsịrị.+ 31  Ihe ahụ o mere mere ka a kpọọ ya onye ezi omumeN’ọgbọ niile, ruo mgbe ebighị ebi.+ 32  Ha kpasuru Chineke iwe na mmiri Meriba.* Mosis wee banye ná nsogbu n’ihi ha.+ 33  Ha mere ihe wutere ya,Ya ekwuo okwu n’echeghị echiche.+ 34  Ha ebibighị mba dị iche iche,+Otú Jehova nyere ha n’iwu.+ 35  Kama ha na ndị mba ọzọ nọ na-emekọ ihe.+ Ha wee mewe ka ha.*+ 36  Ha nọ na-efe arụsị ha dị iche iche,+Arụsị ndị ahụ ghọkwaara ha ọnyà.+ 37  Ha ji ụmụ ha ndị nwokeNa ụmụ ha ndị nwaanyị na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà.+ 38  Ha nọ na-egbu* ndị aka ha dị ọcha,+Ya bụ, ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,Ndị ha ji chụọrọ arụsị dị iche iche ndị Kenan na-efe àjà.+ Ọbara ndị ha gburu wee merụọ ala ahụ. 39  Ihe ndị ha na-eme mere ka ha gharazie ịdị ọcha. Ha kpara àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke fewe chi ọzọ.+ 40  Jehova wee wesa ndị ya iwe dị ọkụ,Ọ kpọkwara ndị o ketara asị. 41  O nyefere ha n’aka ndị mba ọzọ ugboro ugboro,+Ka ndị kpọrọ ha asị chịwa ha.+ 42  Ndị iro ha megburu ha,Chịakwa ha. 43  Ọ napụtara ha ọtụtụ ugboro.+ Ma ha na-eme isi ike, na-enupụkwa isi,+A na-emechukwa ha ihu n’ihi mmehie ha.+ 44  Ma ọ na-ahụ ahụhụ ha na-ata,+Na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka.+ 45  O ji maka ha na-echeta ndụ ya na ha gbara,Ọ na-emetekwara ha ebere n’ihi ịhụnanya ya nke dị ukwuu.+ 46  Ọ na-eme ka ndị niile dọọrọ ha n’agha+Metere ha ebere. 47  Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị.+ Sikwa ná mba dị iche iche kpọkọta anyị,+Ka anyị wee too aha nsọ gị,Jirikwa ọṅụ na-eto gị.+ 48  Ka a na-eto Jehova bụ́ Chineke IzrelRuo mgbe ebighị ebi.*+ Ka mmadụ niile sịkwa, “Amen!”* Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “aghọtaghị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt.”
Ma ọ bụ “ọzara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ya bụ, àjà ndị a chụụrụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ chi na-adịghị ndụ.
Meriba pụtara “Esemokwu.”
Ma ọ bụ “mụta ihe ha na-eme.”
Na Hibru, “na-awụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.