Abụ Ọma 106:1-48
106 Toonụ Jaa!*
Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
2 Ònye ga-akọsali nnukwu ọrụ niile Jehova na-arụMa ọ bụ kọsaa ihe ọma niile ọ na-eme?+
3 Ndị na-ekpe ikpe ziri ezi,Bụ́ ndị na-eme ihe dị mma mgbe niile, na-enwe obi ụtọ.+
4 Jehova, biko, cheta m mgbe ị na-emere ndị gị amara.+
Lekọta m ma zọpụta m,
5 Ka ihe ọma ị na-emere ndị ị họọrọ wee baara m uru,+Ka m wee soro mba gị ṅụrịa ọṅụ,Ka m wee jiri obi ụtọ soro ndị i ketara too gị.
6 Anyị emehiela otú nna nna anyị hà mehiere.+
Anyị emeela ihe ọjọọ. Anyị akpaala àgwà ọjọọ.+
7 Nna nna anyị hà ejighị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt kpọrọ ihe.*
Ha echetaghị ịhụnanya gị nke dị ukwuu,Kama ha nupụrụ isi n’oké osimiri, n’Oké Osimiri Uhie.+
8 Ma ọ zọpụtara ha n’ihi aha ya,+Ka o wee mee ka a mara na ọ dị ike.+
9 Ọ baara Oké Osimiri Uhie mba, ya ataa.
O duuru ha si n’ala ala osimiri ahụ gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa.*+
10 Ọ zọpụtara ha n’aka onye kpọrọ ha asị,+Napụtakwa ha n’aka onye iro.+
11 Mmiri kpuchiri ndị iro ha.
E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ.+
12 Ha nweziri okwukwe ná nkwa o kwere.+
Ha malitere ịbụ abụ, na-eto ya.+
13 Ma ha chefuru ihe ndị o mere ngwa ngwa.+
Ha echereghị ka o nye ha ntụziaka.
14 Kama ha nwewere akpịrị ogologo n’ala ịkpa.+
Ha nwara Chineke n’ọzara.+
15 O nyere ha ihe ha rịọrọ,Ma o mere ka ha malite ịrịa ọrịa ọjọọ nke mere ka ike na-agwụ ha* ma mechaa gbuo ha.+
16 Ha nweere Mosis anyaụfụ n’ebe ha mara ụlọikwuu.
Ha nwekwaara Erọn,+ bụ́ onye nsọ Jehova,+ anyaụfụ.
17 Ala wee meghee loo DetanMa kpuchie ndị ha na Abaịram gbakọtara.+
18 Ọkụ rere ìgwè mmadụ ahụ.
Ọkụ regburu ndị ọjọọ ahụ.+
19 Ha kpụrụ nwa ehi na Horeb,Kpọọkwara ihe e ji ọla kpụọ isiala.+
20 Ha fewere ihe yiri oké ehi nke na-ata ahịhịa+Kama ito m.
21 Ha chefuru Chineke,+ Onye Nzọpụta ha,Onye mere ihe ndị dị ịtụnanya n’Ijipt,+
22 Onye rụrụ ọrụ ndị dị ebube n’ala Ham,+Meekwa ihe ndị dị egwu n’Oké Osimiri Uhie.+
23 Ọ fọrọ obere ka o nye iwu ka e kpochapụ ha.
Ma Mosis, onye ọ họọrọ, rịọrọ ya arịrịọKa ọnụma ya dajụọ.+
24 Ha wee gosi na e nweghị ihe ha ji ọmarịcha ala ahụ kpọrọ.+
Ha enweghị okwukwe ná nkwa ya.+
25 Ha nọ na-atamu ntamu n’ụlọikwuu ha.+
Ha egeghị ntị n’olu Jehova.+
26 N’ihi ya, o weliri aka ṅụọ iyiNa ya ga-eme ka ha nwụọ n’ala ịkpa.+
27 Ọ ga-eme ka ụmụ ha nwụọ ná mba dị iche iche,Ọ ga-achụgakwa ha n’ala dị iche iche.+
28 Ha wee soro fee Bel nke Piọ,+Ha rikwara ihe a chụụrụ ndị nwụrụ anwụ n’àjà.*
29 Àgwà ha kpasuru Chineke iwe.+
Ọrịa ọjọọ wee malite ịrịa ha.+
30 Ma mgbe Finihas biliri mee ihe,Ọrịa ọjọọ ahụ kwụsịrị.+
31 Ihe ahụ o mere mere ka a kpọọ ya onye ezi omumeN’ọgbọ niile, ruo mgbe ebighị ebi.+
32 Ha kpasuru Chineke iwe na mmiri Meriba.*
Mosis wee banye ná nsogbu n’ihi ha.+
33 Ha mere ihe wutere ya,Ya ekwuo okwu n’echeghị echiche.+
34 Ha ebibighị mba dị iche iche,+Otú Jehova nyere ha n’iwu.+
35 Kama ha na ndị mba ọzọ nọ na-emekọ ihe.+
Ha wee mewe ka ha.*+
36 Ha nọ na-efe arụsị ha dị iche iche,+Arụsị ndị ahụ ghọkwaara ha ọnyà.+
37 Ha ji ụmụ ha ndị nwokeNa ụmụ ha ndị nwaanyị na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà.+
38 Ha nọ na-egbu* ndị aka ha dị ọcha,+Ya bụ, ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,Ndị ha ji chụọrọ arụsị dị iche iche ndị Kenan na-efe àjà.+
Ọbara ndị ha gburu wee merụọ ala ahụ.
39 Ihe ndị ha na-eme mere ka ha gharazie ịdị ọcha.
Ha kpara àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke fewe chi ọzọ.+
40 Jehova wee wesa ndị ya iwe dị ọkụ,Ọ kpọkwara ndị o ketara asị.
41 O nyefere ha n’aka ndị mba ọzọ ugboro ugboro,+Ka ndị kpọrọ ha asị chịwa ha.+
42 Ndị iro ha megburu ha,Chịakwa ha.
43 Ọ napụtara ha ọtụtụ ugboro.+
Ma ha na-eme isi ike, na-enupụkwa isi,+A na-emechukwa ha ihu n’ihi mmehie ha.+
44 Ma ọ na-ahụ ahụhụ ha na-ata,+Na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka.+
45 O ji maka ha na-echeta ndụ ya na ha gbara,Ọ na-emetekwara ha ebere n’ihi ịhụnanya ya nke dị ukwuu.+
46 Ọ na-eme ka ndị niile dọọrọ ha n’agha+Metere ha ebere.
47 Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị.+
Sikwa ná mba dị iche iche kpọkọta anyị,+Ka anyị wee too aha nsọ gị,Jirikwa ọṅụ na-eto gị.+
48 Ka a na-eto Jehova bụ́ Chineke IzrelRuo mgbe ebighị ebi.*+
Ka mmadụ niile sịkwa, “Amen!”*
Toonụ Jaa!*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “aghọtaghị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt.”
^ Ma ọ bụ “ọzara.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
^ Ya bụ, àjà ndị a chụụrụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ chi na-adịghị ndụ.
^ Meriba pụtara “Esemokwu.”
^ Ma ọ bụ “mụta ihe ha na-eme.”
^ Na Hibru, “na-awụfu ọbara.”
^ Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
^ Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.

