Abụ Ọma 53:1-6

  • Ihe e ji mara ndị nzuzu

    • “Jehova adịghị” (1)

    • “E nweghị onye na-eme ihe dị mma” (3)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda Mehalat* kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid. 53  Ndị nzuzu* na-asị n’obi ha: “Jehova adịghị.”+ Ihe ọjọọ ha na-eme rụrụ arụ, na-asọkwa oyi. E nweghị onye na-eme ihe dị mma.+   Ma Chineke si n’eluigwe na-ele ndị mmadụ anya+Ka ọ hụ ma è nwere onye na-aghọta ihe, ma è nwere onye na-achọ Jehova.+   Ha niile akwụsịla ime ihe dị mma. Ha niile rụrụ arụ. E nweghị onye na-eme ihe dị mma,E nweghịdị otu onye.+  Ọ̀ bụ na e nweghị onye na-aghọta ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ? Ha na-eri ndị m ka à ga-asị na ha na-eri nri.* Ha anaghị efe Jehova.+   Ma oké ụjọ ga-ejide ha,Ụdị ụjọ na-atụtụbeghị ha,*N’ihi na Chineke ga-atụsasị ọkpụkpụ ndị na-alụso gị ọgụ. Ị ga-emenye ha ihere, n’ihi na Jehova ajụla ha.   Ọ dị m ka ya bụrụ na a ga-esi na Zayọn zọpụta ndị Izrel.+ Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka ndị Izrel nweekwa obi ụtọMgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ndị na-enweghị uche.”
Na Hibru, “achịcha.”
O nwere ike ịbụ, “Ha ga-atụ ụjọ n’ebe ha na-ekwesịghị ịtụ ụjọ.”