Abụ Ọma 130:1-8

  • “M nọ ná nnukwu nsogbu na-akpọ gị”

    • “A sị na ọ bụ mmehie ka ị na-ele” (3)

    • Jehova na-agbaghara mmehie n’eziokwu (4)

    • “M na-echeresi Jehova ike” (6)

Abụ Mgbago. 130  Jehova, m nọ ná nnukwu nsogbu* na-akpọ gị.+  2  Jehova, biko, nụrụ olu m. Nụrụ arịrịọ m na-arịọ gị ka i nyere m aka.  3  Jaa,* a sị na ọ bụ mmehie ka ị na-ele,*Jehova, ònye ka ikpe na-agaghị ama?+  4  N’ihi na ị na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha n’eziokwu,+Ka e wee na-akwanyere gị ùgwù.*+  5  M nwere olileanya n’ebe Jehova nọ. M* nwere olileanya n’ebe ọ nọ. M tụkwasịrị okwu ya obi.  6  M* na-echeresi Jehova ike+Karịa otú ndị nche si eche ka chi bọọ,+Karịa otú ndị nche si atụsi anya ike ka chi bọọ.  7  Ka ndị Izrel na-echere JehovaN’ihi na Jehova anaghị ahapụ ndị ọ hụrụ n’anya,+O nwekwara nnukwu ike ọ ga-eji gbapụta ha.  8  Ọ ga-agbaghara ndị Izrel mmehie ha niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ala ala mmiri.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “na-agụkọ.”
Na Hibru, “na-atụ egwu gị.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”