Abụ Ọma 135:1-21
135 Toonụ Jaa!*
Toonụ aha Jehova.
Unu ndị ohu Jehova, toonụ ya,+
2 Unu ndị na-eje ozi n’ụlọ Jehova,N’ogige ụlọ Chineke anyị.+
3 Toonụ Jaa, n’ihi na Jehova dị mma.+
Bụọnụ abụ iji too aha ya, n’ihi na aha ya dị mma.
4 N’ihi na Jaa ahọrọla Jekọb ka ọ bụrụ nke ya.
Ọ họrọla ndị Izrel ka ha bụrụ ndị ya pụrụ iche.+
5 N’ihi na o doro m anya na Jehova bụ onye ukwu.
Onyenwe anyị ka chi ọzọ niile.+
6 Jehova na-eme ihe ọ bụla dị ya mma,+Ma n’eluigwe ma n’ụwa, ma n’oké osimiri ma na mmiri niile miri emi.
7 Ọ na-eme ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.
Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.
Ọ na-eme ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+
8 O gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,Ma mmadụ ma anụmanụ.+
9 O mere ihe àmà, rụọkwa ọrụ ebube n’Ijipt,+Iji taa Fero na ndị niile na-ejere ya ozi ahụhụ.+
10 O bibiri ọtụtụ mba,+Gbuokwa ndị eze dị ike,+
11 Ya bụ, Saịhọn eze ndị Amọraịt+Na Ọg eze Beshan.+
O bibiri alaeze niile dị na Kenan.
12 O nyere ndị ya ala ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara,Ka ọ bụrụ ihe ndị ya Izrel ketara.+
13 Jehova, aha gị na-adịru mgbe ebighị ebi.
Jehova, ị na-ede ude* n’ọgbọ niile.+
14 N’ihi na Jehova ga-agbachitere ndị ya,+Ọ ga-emekwara ndị ohu ya ebere.+
15 E ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ arụsị mba dị iche iche na-efe.
Ọ bụ mmadụ kpụrụ ha.+
16 Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu.+
Ha nwere anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.
17 Ha nwere ntị, ma ha anaghị anụ ihe.
Ha anaghị eku ume.+
18 Ndị na-akpụ ha ga-adị nnọọ ka ha,+Ndị niile tụkwasịrị ha obi ga-adịkwa ka ha.+
19 Ezinụlọ Izrel, toonụ Jehova.
Ezinụlọ Erọn, toonụ Jehova.
20 Ezinụlọ Livaị, toonụ Jehova.+
Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ Jehova.
21 Ka e si na Zayọn too Jehova,+Onye bi na Jeruselem.+
Toonụ Jaa!+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “ígwé ojii.”
^ Ma ọ bụ “aha gị ga-adị.” Na Hibru, “a ga na-echeta gị.”