Abụ Ọma 125:1-5
Abụ Mgbago.
125 Ndị tụkwasịrị Jehova obi+Dị ka Ugwu Zayọn, bụ́ ugwu a na-enweghị ike ime ka ọ maa jijiji,Kama ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.+
2 Otú ahụ ugwu dị iche iche si gbaa Jeruselem gburugburu+Ka Jehova si gbaa ndị ya gburugburu,+Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
3 Onye ajọ omume* agaghị anọ na-achị ndị ezi omume,+Ka ndị ezi omume wee ghara ịgbanwe mewe ihe ọjọọ.+
4 Jehova, biko, meere ndị ezigbo mmadụ ihe ọma,+Bụ́ ndị obi ha dị ọcha.+
5 Ma Jehova ga-ebibi ndị hapụrụ ụzọ dị mma soro ụzọ gbagọrọ agbagọ.
Ọ ga-ebibi ha na ndị na-eme ihe ọjọọ.+
Ka udo dịrị Izrel.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Mkpanaka ajọ omume.”