Abụ Ọma 121:1-8

  • Jehova na-eche ndị ya nche

    • ‘Ọ bụ Jehova ga-enyere m aka’ (2)

    • Jehova anaghị ehi ụra (3, 4)

Abụ Mgbago. 121  M lere anya n’ugwu dị iche iche,+ sị: Olee onye ga-enyere m aka?   Ọ bụ Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa,Ga-enyere m aka.+   E nweghị mgbe ọ ga-ekwe ka ụkwụ gị mịchapụ.*+ E nweghị mgbe ụra ga-atụ Onye na-eche gị nche.   Lee, ụra agaghị atụ Onye na-eche Izrel nche,+Ọ gaghịkwa ehi ụra.   Jehova na-eche gị nche. Jehova bụ ndò gị,+ ọ nọkwa n’aka nri gị.+   Anwụ agaghị achagbu gị n’ehihie,+Ọnwa agaghịkwa eme gị ihe ọ bụla n’abalị.+   Jehova ga-eche gị nche ka ihe ọ bụla ghara ime gị.+ Ọ ga-eche gị* nche.+   Jehova ga-eche gị nche n’ihe niile ị na-eme*Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “maa jijiji.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “mgbe ị na-apụ apụ na mgbe ị na-abata abata.”