Abụ Ọma 29:1-11
Abụ Devid.
29 Unu ụmụ ndị dike, toonụ Jehova,Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+
2 Toonụ Jehova n’ihi na e kwesịrị ito aha ya.
Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*
3 A na-anụ ụda olu Jehova n’elu ígwé ojii.*
Olu Chineke, onye dị ebube, na-ada ka égbè eluigwe.+
Jehova nọ n’elu ígwé ojii.*+
4 Olu Jehova dị ike.+
Olu Jehova dị ebube.
5 Olu Jehova na-agbaji osisi sida.
N’eziokwu, Jehova na-agbajisị osisi sida ndị dị na Lebanọn.+
6 Ọ na-eme ka Lebanọn* na-awụgharị ka nwa ehi,Na-emekwa ka Siriọn+ na-awụgharị ka nwa atụ́.
7 Olu Jehova na-eme ka àmụ̀mà gbuo.+
8 Olu Jehova na-eme ka ala ịkpa maa jijiji.+
Jehova na-eme ka ala ịkpa Kedesh+ maa jijiji.
9 Olu Jehova na-eme ka nne mgbada maa jijiji wee mụọ nwa,Ọ na-emekwa ka oké ọhịa tọgbọrọ chakoo.+
Ndị niile nọ n’ụlọ nsọ ya na-asị: “Toonụ Chineke!”
10 Jehova nọ n’ocheeze ya nke dị n’elu ọtụtụ mmiri.*+
Jehova nọ n’ocheeze ya. Ọ bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi.+
11 Jehova ga-enye ndị ya ume.+
Jehova ga-agọzi ndị ya, mee ka ha nọrọ n’udo.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “Feenụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa nsọ.”
^ Na Hibru, “mmiri dị iche iche.”
^ Na Hibru, “mmiri dị iche iche.”
^ O nwere ike ịbụ ugwu ndị dị na Lebanọn ka a na-ekwu.
^ Ma ọ bụ “oké osimiri dị n’eluigwe.”