Abụ Ọma 32:1-11
Abụ Devid. Maskil.*
32 Onye Chineke gbaghaara ihe ọjọọ o mere, ya bụ, onye e kpuchiri* mmehie ya, na-enwe obi ụtọ.+
2 Onye Jehova weere ka onye ikpe na-amaghị,+Ya bụ, onye na-anaghị aghọ aghụghọ, na-enwe obi ụtọ.
3 Mgbe m gbara nkịtị, ike gwụruru m n’ọkpụkpụ maka na m nọ na-asụ ude n’akwụsịghị akwụsị.+
4 N’ihi na ma n’ehihie ma n’abalị, iwe ị na-ewesa m* na-anyịgbu m ka à ga-asị na ọ bụ ibu dị arọ.+
Ume dị m n’ahụ́ gwụrụ ka ebe anwụ mịkọọrọ mmiri n’oge ọkọchị. (Sila)
5 M mechara kwupụtara gị mmehie m.
Ekpuchighị m njehie m.+
M sịrị: “M ga-ekwupụtara Jehova ihe ọjọọ ndị m mere.”+
Ị gbaghaara m mmehie m niile.+ (Sila)
6 Ọ bụ ya mere onye ọ bụla nke jisiri gị aka ike ga-eji rịọ gị arịrịọ n’ekpere+Mgbe a ka nwere ike ịchọta gị.+
Mgbe ahụ, nsogbu ndị yiri idei mmiri agaghị eru n’ebe ọ nọ.
7 Ị bụụrụ m ebe nzuzo.
Ị ga-echebe m n’oge nsogbu.+
Ị ga-eme ka ndị ga-eti mkpu ọṅụ maka na ị napụtala m gbaa m gburugburu.+ (Sila)
8 “M ga-eme ka ị mara ihe, zikwa gị ụzọ i kwesịrị iso.+
M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adịkwa n’ebe ị nọ.+
9 Unu emela ka ịnyịnya ma ọ bụ jakị na-anaghị aghọta ihe,+Nke ị ga-ejirịrị eriri ma ọ bụ ụdọ dọrọTupu ya abịa gị nso.”
10 Onye ajọ omume na-atagbu onwe ya n’ahụhụ.
Ma ịhụnanya Jehova na-echebe onye tụkwasịrị ya obi.+
11 Unu ndị ezi omume, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi Jehova, nweekwanụ obi ụtọ.
Tienụ mkpu ọṅụ, unu niile ndị obi ha dị ọcha.