Abụ Ọma 58:1-11
-
Chineke na-ekpe ụwa ikpe
-
Ekpere e kpere ka a taa ndị ọjọọ ahụhụ (6-8)
-
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.*
58 Unu ndị mmadụ, ùnu ga-ekwuli banyere ezi omume mgbe unu gbachiri nkịtị?+
Ùnu ga-ekpeli ikpe ziri ezi?+
2 Kama ime otú ahụ, unu na-echepụta ihe ọjọọ n’obi unu,+Jirikwa aka unu na-eme ihe na-adịghị mma n’ala unu.+
3 Ndị ajọ omume na-amalite mgbe a mụrụ ha* mewe ihe ọjọọ.*
Ha na-enupụ isi. Ha bụ ndị ụgha malite mgbe a mụrụ ha.
4 Okwu ha yiri elò agwọ.+
Ha na-akpọchi ntị ka agwọ ubí nke mechiri ntị ya.
5 Ọ gaghị ege ndị chọrọ ịrata ya ntịN’agbanyeghị otú ọgwụ ha si akpa ike.
6 Chineke, biko, kụpụsịa ha ezé n’ọnụ.
Jehova, biko, kụwaa ndị a yiri ọdụm agba.
7 Ka ha pụọ n’anya ka mmiri na-asọpụ asọpụ.
Ka Chineke kwee ụta ya ma jiri akụ́ ya gbatuo ha.
8 Ka ha dị ka eju nke na-achọ ịnwụ anwụ.*
Ka ha dị ka nwa nwụrụ n’ime afọ nke na-ahụghị ìhè anyanwụ.
9 Tupu ite unu sikwasịrị n’ọkụ unu ji osisi ogwu kwanye anụrụ ọkụ,Chineke ga-ebufu ma osisi ogwu ndị nke na-akpọbeghị nkụ ma ndị nke na-enwu ọkụ, otú oké ifufe si ebufu ihe.+
10 Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ maka na ọ hụla ọbọ Chineke bọrọ.+
Ọ ga-azọnye ụkwụ n’ọbara ndị ajọ omume.+
11 Ndị mmadụ ga-asịzi: “N’eziokwu, onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ.+
N’eziokwu, e nwere Chineke bụ́ onye na-ekpe ụwa ikpe.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “n’akpa nwa.”
^ Ma ọ bụ “mebie.”
^ Na Hibru, “nke na-agbaze agbaze mgbe ọ na-arị.”