Abụ Ọma 101:1-8

  • Eze nke na-erubere Chineke isi

    • ‘Agaghị m agbachi ndị dị mpako nkịtị’ (5)

    • ‘M ga-emere ndị na-erube isi amara’ (6)

Abụ Devid. 101  M ga-abụ abụ banyere ịhụnanya Chineke nakwa otú o si ekpe ikpe ziri ezi. Jehova, m ga-abụku gị abụ otuto.   M ga-akpa àgwà otú gosiri na m ma ihe nakwa na m bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta. Olee mgbe ị ga-enyere m aka? M ga-eji obi m niile na-erubere gị isi+ n’ime ụlọ m.   Agaghị m edowe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m. M kpọrọ omume ndị na-akwụsị ime ihe dị mma asị.+ E nweghị ihe jikọrọ mụ na ha.   Anaghị m aga onye aghụghọ* nso. Agaghị m anabata* ihe ọjọọ.   M ga-emechi ọnụ*Onye ọ bụla nke na-ekwutọ onye agbata obi ya na nzuzo.+ Agaghị m agbachiOnye ọ bụla dị mpako na onye na-ebuli onwe ya elu nkịtị.   M ga-emere ndị na-erube isi n’ụwa amara,Ka ha wee binyere m. Onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta* ga-ejere m ozi.   E nweghị onye aghụghọ ga-ebi n’ụlọ m,E nweghịkwa onye na-agha ụgha ga-eguzo n’ihu m.   Kwa ụtụtụ, m ga na-emechi ọnụ* ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa,Ka m wee si n’obodo Jehova kpochapụ ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye obi ya gbagọrọ agbagọ.”
Na Hibru, “ama.”
Ma ọ bụ “ga-ebibi.”
Ma ọ bụ “Onye na-akwụwa aka ọtọ.”
Ma ọ bụ “ga na-ebibi.”