Abụ Ọma 35:1-28
Abụ Devid.
35 Jehova, biko, kpechite ọnụ m n’ikpe mụ na ndị iro m.+
Lụso ndị na-alụso m ọgụ ọgụ.+
2 Buru obere ọta gị na nnukwu ọta gị,+Biliekwa gbachitere m.+
3 Bulie ube gị na anyụike e ji alụ agha* lụso ndị na-achụ m ọsọ ọgụ.+
Gwa m,* sị: “Ọ bụ m na-azọpụta gị.”+
4 Ka ihere mee ndị na-achọ igbu m,* ka e mechuokwa ha ihu.+
Ka ndị na-akpa nkata igbu m gbaghachi azụ n’ihere.
5 Ka ha dị ka mkpo ọka* ifufe na-eburu.
Ka mmụọ ozi Jehova chụsasịa ha.+
6 Mgbe mmụọ ozi Jehova na-achụ ha ọsọ,Ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, na-amịkwa amị.
7 N’ihi na ha ejirila ụgbụ siere m ọnyà n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha.
Ha egwuorola m* olulu n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha.
8 Ka ọdachi dakwasị ha na mberede.
Ka ụgbụ ha ji sie ọnyà jide ha.
Ka ha daba na ya wee nwụọ.+
9 Ma m* ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.
M ga-enwe obi ụtọ maka na ọ na-azọpụta m.
10 M ga-eji obi m niile sị:
“Jehova, ònye dị ka gị?
Ị na-anapụta ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka n’aka ndị ka ha ike,+Ị na-anapụtakwa ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka na ndị ogbenye n’aka ndị na-anara ha ihe ha.”+
11 Ndị akaebe ụgha na-abịa,+Na-ebo m ihe m na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya.
12 Ha na-eji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ ihe ọma,+Na-eme ka obi dị m* ka onye mmadụ nwụnahụrụ.
13 Ma mgbe ha na-arịa ọrịa, m yiiri ákwà iru uju.
M buru ọnụ wee taa onwe m ahụhụ.
Mgbe a na-azaghịkwa ekpere m,
14 M nọ na-agagharị na-eru uju ka à ga-asị na ha bụ ndị enyi m ma ọ bụ ụmụnne m.
M nọ na-eru uju ka onye nne ya nwụrụ.
15 Ma mgbe nsogbu bịaara m, ha ṅụrịrị ọṅụ ma gbakọọ.
Ha gbakọrọ zoo ka ha tie m ihe.
Ha dọriri m, ha emechighịkwa ọnụ.
16 Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na-akparị m ma na-achị m ọchị.*
Ha na-ata ikikere ezé n’ihi iwe ha na-ewesa m.+
17 Biko, Jehova, olee mgbe ị ga-akwụsị ịna-ele naanị n’anya?+
Napụta m* ka ha ghara igbu m.+
Napụta ndụ m* n’aka ọdụm.+
18 Mgbe ahụ, m ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu kelee gị.+
M ga-anọ n’etiti ìgwè mmadụ too gị.
19 Ekwela ka ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.
Ekwela ka ndị kpọrọ m asị n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha+ rọọ m anya.+
20 N’ihi na ha anaghị ekwu okwu na-eme ka obi ruo mmadụ ala,Kama ha na-eji aghụghọ akpara ndị na-achọ udo nkata ọjọọ.+
21 Ha na-emeghe ọnụ ha ka ha bo m ebubo.
Ha na-asị: “Ntọọ! Ntọọ! Anyị ahụla ya.”
22 Jehova, ị hụla ihe merenụ. Agbachizila nkịtị.+
Jehova, biko, anọla m n’ebe dị anya.+
23 Biko, gee ntị, bilie gbachitere m.
Jehova, Chineke m, kpechite ọnụ m.
24 Jehova Chineke m, biko, gosi na ị bụ onye ezi omume+ mgbe ị na-ekpe m ikpe.
Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.
25 Biko, ekwela ka ha gwa onwe ha, sị: “Ntọọ ya! Anyị enwetala ihe anyị chọrọ.”
Ekwela ka ha sị: “Anyị alaala ya n’iyi.”+
26 Ka ihere mee ndị niile na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọdachi dakwasịrị m,Ka e mechuokwa ha niile ihu.
Ka e menye ndị na-eche na ha ka m mma ezigbo ihere, ka a kpụọkwa ùgwù ha n’ala.
27 Ma, ka ndị obi dị ụtọ na m na-eme ezi omume tie mkpu ọṅụ.
Ka ha na-ekwu mgbe niile, sị:
“Ka e too Jehova, onye obi na-adị mma na ohu ya nọ n’udo.”+
28 Mgbe ahụ, m ga na-akọsa ezi omume gị*+Ma na-eto gị mgbe niile.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “anyụike nwere ihu abụọ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na-akparị m ka e wee nye ha achịcha.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “na-echebara ezi omume gị echiche.”