Abụ Ọma 108:1-13

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka o merie ndị iro ya

    • Mmadụ ịzọpụta anyị abaghị uru (12)

    • “Ọ bụ Chineke ga-enye anyị ike” (13)

Abụ Devid. Abụ ọma. 108  Chineke, obi siri m ike. M ga-eji obi m niile kpọọrọ gị egwú, bụọkwara gị abụ otuto.+   Ụbọ akwara, teta. Tetakwa, gị une.+ M ga-ebili n’isi ụtụtụ.   Jehova, m ga-anọ n’ihu ndị obodo dị iche iche too gị. M ga-abụku gị abụ otuto ná mba dị iche iche.   N’ihi na ịhụnanya gị* dị ukwuu nke na ọ na-eru n’eluigwe,+Ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.*   Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe. Ka e too gị n’ụwa niile.+   Biko, jiri ike* gị zọpụta anyị ma za anyị,*Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya.+   Chineke, Onye dị nsọ, ekwuola,* sị: “M ga-aṅụrị ọṅụ. M ga-ewere Shikem+ nye ndị m chọrọ ka ọ bụrụ ihe ha ketara. M ga-atụkwa Ndagwurugwu Sọkọt+ atụ̀ nye ndị m chọrọ.   Ọ bụ m nwe Gilied,+ ọ bụkwa m nwe Manase. Ifrem bụ okpu m na-ekpu n’isi.+ Juda bụ mkpara na-egosi ikike m nwere.+   Moab bụ efere m ji asa ihe.+ M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m n’Ịdọm.+ M ga-eti mkpu ọṅụ maka na m ga-emeri Filistia.”+ 10  Ònye ga-eduru m gaa n’obodo a rụsiri ike? Ònye ga-edu m ruo n’Ịdọm?+ 11  Chineke, ọ́ bụghị gị, onye jụrụ anyị,Chineke anyị, onye na-anaghịzi anọnyere ndị agha anyị ma ha gaa agha?+ 12  Napụta anyị n’ahụhụ anyị na-ata,+N’ihi na mmadụ ịzọpụta anyị abaghị uru.+ 13  Ọ bụ Chineke ga-enye anyị ike,+Ọ ga-azọpịakwa ndị iro anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “ruo na mbara igwe.”
Na Hibru, “aka nri.”
Na Hibru, “za m.”
O nwere ike ịbụ, “Chineke ekwuola n’ebe nsọ ya.”