Abụ Ọma 38:1-22

  • Ekpere onye chegharịrị echegharị kpere

    • ‘M na-echegbu onwe m, obi dara m mbà’ (6)

    • Jehova na-aza ekpere ndị na-echere ya (15)

    • “Mmehie m nọ na-ewute m” (18)

Abụ Devid, nke e ji echeta ihe. 38  Jehova, biko, abarala m mba n’iwe gị,Ejikwala iwe dọọ m aka ná ntị.+  2  N’ihi na akụ́ gị abamiela n’ahụ́ m,Ahụhụ ị na-ata m na-enyekwa m nsogbu n’ahụ́.*+  3  Ahụ́ niile na-egbu m mgbu n’ihi iwe gị. Obi anaghị ezu m ike* n’ihi mmehie m.+  4  N’ihi na mmehie ndị m mere erikpuola isi m.+ Ha dị ka ibu na-anyị arọ. Agaghị m ebuli ha.  5  Ọnyá ndị dị m n’ahụ́ na-esi ísì, na-abasakwa abasaN’ihi nzuzu m.  6  M na-echegbu onwe m, obi dakwara m mbà. Iwe juru m obi malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.  7  Ime ahụ́ na-ere m ọkụ. Ahụ́ niile na-egbu m mgbu.+  8  Ahụ́ akụnwụọla m, ike ụwa agwụkwala m. M na-asụsi ude ike n’ihi otú iwe si ju m obi.  9  Jehova, ị ma ihe niile m chọrọ,Ị na-anụkwa ọsụ m na-ama. 10  Obi na-akụ m kpum kpum. Ike agwụla m,Anya m anaghịkwa ahụ ụzọ.+ 11  Ndị enyi m na ndị mụ na ha na-akpa na-agbara m ọsọ n’ihi ọrịa m,Ndị mụ na ha dị n’ezigbo mma anaghịkwa abịa m nso. 12  Ndị na-achọ igbu m* na-esiri m ọnyà. Ndị na-achọ imerụ m ahụ́ na-akpa otú ha ga-esi laa m n’iyi.+ Ihe ha na-ekwu malite n’ụtụtụ ruo n’abalị bụ aghụghọ ha ga-aghọ. 13  Ma m na-eme ka onye ntị chiri. Anaghị m ege ihe ha na-ekwu.+ M na-eme ka onye ogbi. Anaghị m ekwu ihe ọ bụla.+ 14  M dịzi ka onye na-anaghị anụ ihe,Ka onye na-enweghị ihe ọ ga-ekwu iji zara ọnụ ya. 15  N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, ka m cheere,+I wee za m, Jehova Chineke m.+ 16  N’ihi na m sịrị: “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m,Ekwekwala ka ha maliwe elu ma ụkwụ m mịchapụ.” 17  N’ihi na ọ fọrọ obere ka m daruo ala. Ahụ́ na-egbu m mgbu mgbe niile.+ 18  M kwupụtara ihe ọjọọ m mere.+ Mmehie m nọ na-ewute m.+ 19  Ma ndị iro m siri ike,* bụrụkwa ndị dike. Ndị kpọrọ m asị n’enweghị ihe m mere ha dịzi ọtụtụ. 20  Ha ji ihe ọjọọ kwụọ m ụgwọ ihe ọma. Ha nọ na-enye m nsogbu maka na ha achọghị ka m na-eme ihe dị mma. 21  Jehova, biko, ahapụla m. Chineke m, biko, anọla m n’ebe dị anya.+ 22  Jehova, onye na-azọpụta m,+Biko, bịa ngwa ngwa ka i nyere m aka.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Aka gị na-abịada m.”
Na Hibru, “Udo adịrịghị ọkpụkpụ m.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “dị ndụ.”