Abụ Ọma 31:1-24
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
31 Jehova, agbabala m n’ime gị.+
Biko, ekwela ka ihere mee m.+
Napụta m n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
2 Gee m ntị.*
Bịa ọsọ ọsọ napụta m.+
Bụrụ ugwu m na-agbaba na ya,Ebe a rụsiri ike m na-agbaba ka a zọpụta m.+
3 N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike.+
N’ihi aha gị,+ ị ga na-edu m ma na-ezi m ụzọ m ga-eso.+
4 Ị ga-atọpụ m n’ụgbụ ha ji siere m ọnyà,+N’ihi na ị bụ ebe m a rụsiri ike.+
5 M na-enyefe mmụọ m n’aka gị.+
Ị napụtala m, Jehova Chineke, onye eziokwu.*+
6 M kpọrọ ndị na-efe arụsị efu na-abaghị uru asị.
Ma, ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi.
7 M ga-aṅụrị nnukwu ọṅụ n’ihi ịhụnanya gị,*N’ihi na ị hụla otú e si na-emesi m ike.+
Ị ma na m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.
8 I nyefeghị m n’aka onye iro,Kama, i mere ka m kwụrụ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*
9 Jehova, biko meere m amara n’ihi na m na-ahụsi anya.
Uju m na-eru emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ,+ meekwa ka ike gwụchaa m.+
10 Ọ bụ naanị uju ka m na-eru ná ndụ m,+Ọ bụkwa naanị ude ka m na-asụ ná ndụ m.+
Ike na-agwụ m n’ihi mmehie ndị m mere.
Ọkpụkpụ m esighịzi ike.+
11 Ndị iro m niile,+Karịchaa ndị agbata obi m, na-achị m ọchị.
Ndị mụ na ha dị ná mma na-atụ m ụjọ.
Ha hụ m n’èzí, ha agbawa ọsọ.+
12 Obi* ha apụọla n’ebe m nọ. Ha echefuola m ka à ga-asị na mụ anwụọla.
Adị m ka arịa kụwara akụwa.
13 Anụla m ọtụtụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na-ekwu.
Ụjọ zuru m ahụ́.+
Mgbe ha gbakọtara ka otu onye ka ha mesie m ike,Ha na-akpa nkata ka ha gbuo m.*+
14 Ma, Jehova, m tụkwasịrị gị obi.+
Ana m asị: “Ị bụ Chineke m.”+
15 Ndụ m dị gị n’aka.
Napụta m n’aka ndị iro m nakwa n’aka ndị na-akpagbu m.+
16 Meere ohu gị amara.+
Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.*
17 Jehova, biko, ekwela ka ihere mee m mgbe m na-akpọku gị.+
Ka ihere mee ndị ajọ omume.+
Ka e mechie ha ọnụ n’ili.*+
18 Ka ndị na-ekwu okwu ụgha daa ogbi,+Ya bụ, ndị mpako na ịkpọ asị mere ka ha na-ekwutọ onye ezi omume.
19 Ihe ọma ị na-eme karịrị akarị.+
I doweere ya ndị na-atụ egwu gị,+Ọ bụkwa n’ihu mmadụ niile ka ị na-emere ya ndị na-agbaba n’ime gị.+
20 Ị ga-ezo ha n’ebe nzuzo gị+Ka nkata ndị mmadụ kpara ghara ikpudo ha.
Ị ga-ezo ha n’ụlọ gịKa ha ghara ịba n’aka ndị na-ekwu okwu ọjọọ.+
21 Ka e too Jehova,N’ihi otú na-enweghị atụ o si gosi na ọ hụrụ m n’anya*+ mgbe m nọ n’obodo ndị agha nọchibidoro.+
22 Ma ụjọ tụrụ m, m wee sị:
“A ga-ebibi m ka m ghara ịnọkwa n’ihu gị.”+
Ma ị nụrụ arịrịọ m mgbe m besaara gị ákwá ka i nyere m aka.+
23 Unu ndị jisiri Jehova aka ike, hụnụ ya n’anya.+
Jehova na-echebe ndị na-erubere ya isi,+Ma ọ na-ata onye ọ bụla dị mpako nnukwu ahụhụ.+
24 Unu niile ndị na-echere Jehova,+Nweenụ obi ike, ka obi siekwa unu ike.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
^ Ma ọ bụ “onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “n’ebe sara mbara.”
^ Ma ọ bụ “Uche.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”