Abụ Ọma 111:1-10
111 Toonụ Jaa!*+
א [Alef]
M ga-eji obi m niile too Jehova+ב [Bet]N’ebe ìgwè mmadụ ndị obi ha dị ọcha zukọrọ nakwa n’ọgbakọ.
ג [Gimel]
2 Ọrụ niile Jehova na-arụ dị ukwuu.+
ד [Dalet]Ndị niile ọrụ ya na-amasị na-amụ banyere ha.+
ה [Hee]
3 Ihe ndị ọ na-eme dị ebube, maakwa mma.
ו [Wọọ]Ọ bụ onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
ז [Zayin]
4 Ọ na-eme ka a na-echeta ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ.+
ח [Het]
Jehova nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+
ט [Tet]
5 Ọ na-enye ndị na-atụ egwu ya nri.+
י [Yod]
Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+
כ [Kaf]
6 O gosila ndị ya nnukwu ọrụ ndị ọ rụrụ.
ל [Lamed]Otú o si mee ya bụ na o nyere ha ihe* ndị mba ọzọ ketara.+
מ [Mem]
7 Ọrụ aka ya na-egosi na ọ na-ekwu eziokwu, na-ekpekwa ikpe ziri ezi.+
נ [Nun]A ga-atụkwasịli iwu ya niile obi.+
ס [Samek]
8 A ga-atụkwasịli ha obi mgbe niile, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.
ע [Ayin]Onye nyere iwu ndị ahụ bụ onye ezi omume na onye eziokwu.+
פ [Pee]
9 Ọ gbapụtala ndị ya.+
צ [Sadee]
O nyere iwu ka ọgbụgba ndụ ya dịruo mgbe ebighị ebi.
ק [Kof]
Aha ya dị nsọ, bụrụkwa ihe e kwesịrị ịna-atụ egwu.+
ר [Resh]
10 Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova.+
ש [Sin]
Ndị niile na-edebe iwu ya* na-egosi na ha na-aghọta ihe nke ọma.+
ת [Tọọ]
A na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “na-eme amara.”
^ Ya bụ, ala.
^ Na Hibru, “na-edebe ha.”