Abụ Ọma 140:1-13

  • Jehova bụ Onye siri ike na-azọpụta ndị ya

    • Ndị ọjọọ dị ka agwọ (3)

    • Ndị tigbuo zọgbuo ga-ala n’iyi (11)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 140  Jehova, biko, napụta m n’aka ndị ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịba n’aka ndị tigbuo zọgbuo,+   Ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ n’obi ha+Ma na-akpata nsogbu kwa ụbọchị.   Ha na-amụ ire ha ka ọ dị nkọ ka ire agwọ.+ Okwu ọjọọ ndị na-esi ha n’ọnụ apụta dị ka elò ajụala.+ (Sila)   Jehova, biko, chebe m ka m ghara ịba n’aka ndị ajọ omume.+ Chebe m ka m ghara ịba n’aka ndị tigbuo zọgbuo,Ndị na-akpa nkata ka ha kwatuo m.   Ndị mpako siiri m ọnyà. Ha tụsasịrị ụdọ n’akụkụ ụzọ ka ha jide m.+ Ha na-esiri m ọnyà dị iche iche.+ (Sila)   M sịrị Jehova: “Ị bụ Chineke m. Jehova, biko, ṅaa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka.”+   Jehova, Ọkaakaa Onyenwe anyị, Onye siri ike na-azọpụta m,I chebere m* n’ụbọchị agha.+   Jehova, biko, emerela ndị ajọ omume ihe ha chọrọ. Ekwela ka nkata ha na-akpa nwee isi, ka isi ghara ibuwe ha.+ (Sila)   Ka ndị gbara m gburu-gburuJiri isi ha buru ihe ọjọọ ha na-ekwu.+ 10  Ka a wụkwasị ha icheku ọkụ.+ Ka a tụba ha n’ọkụ,N’olulu miri emi,*+ ka ha wee ghara ịpụta ọzọ. 11  Ka onye na-ekwutọ mmadụ ghara ịhụ ebe ọ ga-ebi n’ụwa.*+ Ka ihe ọjọọ chụwa ndị tigbuo zọgbuo ọsọ ma laa ha n’iyi. 12  Ama m na Jehova ga-agbachitere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà haMa kpeere ndị ogbenye ikpe ziri ezi.+ 13  N’eziokwu, ndị ezi omume ga-eto aha gị. Ndị na-eme ihe dị mma ga-ebi n’ihu gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “isi m.”
Ma ọ bụ “N’olulu mmiri.”
Ma ọ bụ “n’ala.”