Abụ Ọma 109:1-31

  • Ekpere onye nọ n’ahụhụ kpere

    • ‘Ka onye ọzọ rụwa ọrụ ọ na-arụbu’ (8)

    • Chineke na-eguzo n’akụkụ ogbenye (31)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 109  Chineke, onye m na-eto,+ biko, agbachizila nkịtị.   N’ihi na onye ajọ omume na onye aghụghọ na-akatọ m. Ha na-ekwu okwu ụgha banyere m.+   Ha na-agba m gburugburu, na-agwa m okwu ọjọọ. Ha na-alụsokwa m ọgụ n’enweghị ihe m mere ha.+   Ha na-emegide m n’agbanyeghị na m hụrụ ha n’anya.+ Ma, m ka na-ekpe ekpere.   Ha na-eji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ ihe ọma,+Ha kpọkwara m asị n’agbanyeghị na m hụrụ ha n’anya.+   Mee ka onye ajọ omume chịwa onye iro m.* Ka onye ga-emegide ya* guzoro n’aka nri ya.   Ka ikpe ma ya mgbe a na-ekpe ya ikpe. Ka e were ekpere ọ na-ekpe ka ihe ọjọọ.+   Ka ọ ghara ịdịte ndụ aka.+ Ka onye ọzọ rụwa ọrụ* ọ na-arụbu.+   Ka ụmụ ya bụrụ ụmụ na-enweghị nna,Ka nwunye ya bụrụkwa nwaanyị di ya nwụrụ. 10  Ka ụmụ ya na-akpagharị na-arịọ arịrịọ,Ka ha si n’ụlọ ha dakpọsịrị adakpọsị gaa na-achọgharị ihe ha ga-eri. 11  Ka onye o ji ụgwọ bukọrọ ihe niile o nwere,Ka ndị ala ọzọ kwakọrọ ngwongwo ya. 12  Ka a ghara inwe onye ga-emere ya ihe ọma,Ka a gharakwa inwe onye ga-emere ụmụ ya, bụ́ ụmụ na-enweghị nna, amara. 13  Ka e gbuo ụmụ ya niile.+ Ka a ghara icheta aha ha n’ọgbọ na-abịa abịa. 14  Ka Jehova cheta mmehie nna nna ya hà,+Ka a gharakwa ichefu mmehie nne ya. 15  Ka Jehova na-echeta ihe ha mere mgbe niile. Ka e chefuokwa aha ha n’ụwa.+ 16  N’ihi na o chetaghị imere ndị ọzọ ihe ọma,+Kama ọ nọ na-achụ ogbenye a na-emegbu emegbu,+ nke obi gbawara,Ka o gbuo ya.+ 17  A bụrụ ya ọnụ maka na ọ na-atọ ya ụtọ ịbụ ndị ọzọ ọnụ. A gọzighị ya maka na ọ naghị achọ ịgọzi ndị ọzọ. 18  Ọnụ a bụrụ ya zuru ya ahụ́ otú uwe si ekpuchi mmadụ ahụ́. Ọ banyere ya n’ahụ́ otú mmiri si abanye mmadụ n’ahụ́,Banyekwa ya n’ọkpụkpụ ka mmanụ. 19  Ka ọnụ a bụrụ ya zuo ya ahụ́ otú uwe ya si ekpuchi ya ahụ́,+Ka ọ dịkwa ka ájị̀ ọ na-eke mgbe niile. 20  Ihe a bụ ụgwọ Jehova na-akwụ onye na-emegide m+Nakwa ndị na-ekwutọ m.* 21  Ma Jehova, Ọkaakaa Onyenwe anyị,Biko, nyere m aka n’ihi aha gị.+ Napụta m n’ihi na ịhụnanya gị* dị mma.+ 22  N’ihi na enweghị m onye na-enyere m aka, m dara ogbenye,+E mewaakwala m obi.+ 23  Ndụ m na-agbada n’ike n’ike ka onyinyo ji nwayọọ nwayọọ apụ mgbe anwụ na-ada. E fechapụla m otú e si efechapụ igurube. 24  Ikpere na-amazi m jijiji n’ihi ọnụ m na-ebu. Ataala m ahụ́, ike na-agwụkwa m. 25  Ha na-akatọzi m.+ Ha hụ m, ha ana-efufe isi.+ 26  Jehova Chineke m, biko, nyere m aka. Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.* 27  Ka ha mara na ihe a si n’aka gị,Na ọ bụ gịnwa, bụ́ Jehova, mere ya. 28  Ha ga-abụ m ọnụ, ma ị ga-agọzi m. Ka e menye ha ihere mgbe ha ga-ebili ka ha mesie m ike,Ma ka ohu gị ṅụrịa ọṅụ. 29  Ka e mechuo ndị na-emegide m ihu. Ka ihere jukwa ha ihu ka à ga-asị na e ji uwe kpuchie ha.+ 30  M ga-eji ọnụ m too Jehova nke ukwuu. M ga-anọ n’ihu ọtụtụ ndị too ya.+ 31  N’ihi na ọ ga-eguzo n’aka nri onye ogbenye,Ka ọ zọpụta ya n’aka ndị na-ama ya* ikpe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye ga-ebo ya ebubo.”
Na Hibru, “chịwa ya.”
Ya bụ, ọrụ ilekọta ọgbakọ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”