Abụ Ọma 85:1-13

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka a nabataghachi ha

    • Chineke ga-agwa ndị ya na udo ga-adịrị ha (8)

    • Ịhụnanya na eziokwu ga-ezute (10)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+ 85  Jehova, i meerela ala gị amara.+ Ị kpọghachitere ụmụ Jekọb a dọọrọ n’agha.+   Ị gbagharala ndị gị ihe ọjọọ ha mere. Ị gbaghaara ha* mmehie ha niile.+ (Sila)   Ị kwụsịrị iwesa ha oké iwe. I mere ka iwe gị dị ọkụ dajụọ.+   Chineke, onye na-azọpụta anyị, biko, nabataghachi* anyị,Biko, ka iwe ị na-ewesa anyị dajụọ.+   Ị̀ ga na-ewesa anyị oké iwe ruo mgbe ebighị ebi?+ Ị̀ ga na-ewesa anyị iwe si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ?   Ọ̀ bụ na ị gaghị eme ka anyị nweghachi ume,Ka ndị gị wee ṅụrịa ọṅụ n’ihi gị?+   Jehova, biko, gosi na ị hụrụ anyị n’anya,*+Zọpụtakwa anyị.   M ga-ege ntị n’ihe ezi Chineke bụ́ Jehova na-ekwu,N’ihi na ọ ga-agwa ndị ya, bụ́ ndị jisiri ya aka ike, na udo ga-adịrị ha,+Ma ka ha ghara ịtụkwasị onwe ha obi ọzọ.+   N’eziokwu, ọ dị njikere ịzọpụta ndị na-atụ egwu ya,+Ka e wee na-ahụ ebube ya n’ala anyị.  10  Ịhụnanya* na eziokwu ga-ezute. Ezi omume na udo ga-esusu ọnụ.+  11  Eziokwu ga-adị ebe niile ka à ga-asị na o si n’ala na-epupụta. Ezi omume Chineke ga-enwu ka ìhè nke na-esi n’eluigwe enwu.*+  12  N’eziokwu, Jehova ga-enye anyị ihe dị mma,*+Ala anyị ga-emekwa nri nke ọma.+  13  Ezi omume ga na-aga n’ihu Chineke,+Ọ ga-awakwa ụzọ n’ebe Chineke zọrọ ụkwụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “I kpuchiri.”
Ma ọ bụ “kpọghachite.”
Ma ọ bụ “gosi anyị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ezi omume ga-esi n’eluigwe ledata anya.”
Ma ọ bụ “ga-eme ka ihe gaziere anyị.”