Abụ Ọma 5:1-12

  • Jehova bụ ebe mgbaba onye ezi omume

    • Chineke kpọrọ ajọ omume asị (4, 5)

    • “Ị bụ onye ezi omume. Biko, duo m” (8)

Maka onye na-eduzi Nihilọt.* Abụ Devid. 5  Jehova, biko, gee ntị n’ihe m na-ekwu.+ Nụrụ ude m na-asụ.  2  Eze m na Chineke m, biko, ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka,N’ihi na ọ bụ gị ka m na-arịọ.  3  Jehova, biko, ị ga-anụ olu m n’ụtụtụ.+ N’ụtụtụ, m ga-akọrọ gị ihe na-echegbu m,+ m ga-atụsikwa anya ike ka ị za m.  4  N’ihi na ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ.+ E nweghị onye na-eme ihe ọjọọ ị ga-ahapụ ka gị na ya biri.+  5  E nweghị onye na-etu ọnụ ga-eguzo n’ihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.+  6  Ị ga-ebibi ndị na-agha ụgha.+ Jehova, ị kpọrọ ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-aghọ aghụghọ* asị.+  7  Ma m ga-abata n’ụlọ gị+ n’ihi ịhụnanya gị* nke dị ukwuu.+ M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala n’ihi na m na-akwanyere gị ezigbo ùgwù.+  8  Jehova, ị bụ onye ezi omume. Biko, duo m n’ihi ndị iro m. Mee ka m nwee ike ịga n’ụzọ gị n’enweghị ihe ga-eme ka m daa.+  9  N’ihi na e nweghị ihe ha na-ekwu e nwere ike ịtụkwasị obi. Ihe juru ha n’obi bụ naanị ịkpọasị. Ọnụ* ha dị ka ili ghe oghe. Ha na-eto mmadụ otuto elu ọnụ.+  10  Ma, Chineke, ị ga-ekwu na ikpe mara ha. Atụmatụ ha ga-akpatara ha ọdachi.+ Ka a chụpụ ha n’ihi na ihe ọjọọ ha na-eme dị ọtụtụ,N’ihi na ha enupụrụla gị isi.  11  Ma ndị niile na-agbaba n’ime gị ga-aṅụrị ọṅụ.+ Ha ga na-eti mkpu ọṅụ mgbe niile. Ị ga-echebe ha,Ndị ji aha gị kpọrọ ihe ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi gị.  12  N’ihi na gịnwa bụ́ Jehova ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume. Ị ga-eji amara* gị gbaa ya gburugburu ka ebe e ji ọta ukwu gbaa mmadụ gburugburu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

^ Ma ọ bụ “onye na-awụfu ọbara ma na-aghọ aghụghọ.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Na Hibru, “Akpịrị.”
^ Ma ọ bụ “ihu ọma.”